You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AFCON 2019 Qualifiers: Oge o ruola ịgbaghara Ighalo maka ihe mere n'Iko Mbaụwa 2018?
Goolu ise onye egwu Naịjirịa bụ Odion Ighalo nyere n'ime egwuregwu abụọ ọ gbarala Naịjirịa n'ọnwa Oktoba emeela ka a kpụrụ ya n'ọnụ ọzọ.
Ọ bụrụ na Ighalo gere ndị Naịjirịa ntị ka o si Iko Mbaụwa 2018 a gbara na Rọshịa lọta, ọ gaara achili ụkwụ elu sị na ọ gaghị agbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ.
Mana n'ime otu izu,site n'Oktoba 13 ruo 17, aha Ighalo nọ n'ọnụ ndị mmadụ maka etu o si gosi ndị Libya nkarị ugboro abụọ ha zutere.
O nyere goolu atọ n'ime otu egwuregwu ka Naịjirịa na Libya zutere n'Oktoba 13, ma nyekwa goolu abụọ ka naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ gachara.
Ighalo malitere n'ewu na Twitter na ebe ndị ọzọ.
Ebe ụfọdụ na-ekwu na ha agbagharala ya maka emeghị nke ọma n'asọmpi Iko Mbaụwa ebe a gbapụrụ Naịjirịa n'oge, ndị ọzọ ekwuola na ha adịbeghị njikere ịgbaghara ya.
Ndị achọghị ịgbaghara ya
@ibkthegreat01 sị na naanị ihe ndị Naịjirịa rịọrọ ya bụ inye otu goolu ka ha na Ajentina zutere, mana o mere ihe e ji gbapụ Naịjirịa.
Ọ sị na ọ ga-agbaghara ya naanị ma ọ bụrụ na ọ ga-enye goolu nke ga-eme ka Naịjirịa bulie Iko mba Afrịka.
@s0m3b0di kwuru sị na Ighalo nyere goolu atọ n'ime otu egwuregwu apụtaghị na a ga-agbaghara ya maka irila Naịjirịa n'Iko Mbaụwa.
@Thayour_B_ kwuru sị na ọ masị Ighalo ya nye goolu iri asaa, na ihe ọ ma bụ na Naịịjirịa apụtaghị n'agba nke otu n'Iko Mbaụwa.
Ndị chọrọ ịgbaghara ya
@iSlimfit sị ka a gbaghara ya maka goolu ise o nyere n'egwuregwu abụọ.
@Nobsdaslushhkid kwuru sị na o weghachịla okwu ọjọọ niile o kwuru maka Ighalo n'asọmpi Iko Mbaụwa.
@Gentlegiantdido kwuru na Ighalo emeela ya obi aṅụrị.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: