Ndị Super Eagles na oji obi ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọtụtụ ndị Naịjirịa nwere ntụkwasị obi na ndị na-agbara otu egwu Naịjirịa bụ Super Eagles bọọlụ, mana kedụ ndị bụ ndị nkwado ha oge ha na-anọghị n'ọdọ egwuregwu?

Ka onye ọbụla na-etinye anya n'ihe gbasara ndị otu Super Eagles, e nwere ndị ha debere n'ụlọ na-akwado ha n'asọmpi ma na-ele anya mgbe ha ga-alọta ka ha nwee ike nọkọọ.

Ndị ahụ bụ nwunye ha na ndị enyi ha nwaanyị.

Ndị a bụ ndị na-agba ha ume ma ọ dị mma ma ọ dị njọ.

BBC Igbo ga-egosi gị ndị a dị mkpa na ndụ ndị Super Eagles.

Ndị ochee goolu

1) Ikechukwu Ezenwa

Ochee goolu Ikechukwu Ezenwa lụrụ nwunye ya bụ Amaka n'afọ 2013. Ha amụtala ụmụ nwoke atọ.

2) Daniel Akpeyi

Akpeyi bụ ochee goolu ndị Super Eagles lụrụ nwunye ya bụ Emmanuella n'afọ 2016.

Ndị na-agba n'azụ:

3) William Troost-Ekong

Troost-Ekong na-ejidere ndị Super Eagles azụ, na enyi ya nwaanyị ayịruola afọ anọ. Enyi ya nwaanyị dị ime nwa ga-abụ nwa mbụ ha.

4) Kenneth Omeruo

Omeruo na-agbara ndị Super Eagles n'azụ, lụrụ nwunye ya bụ Chioma n'ọnwa Mee 2018.

5) Chidozie Awaziem

Chidozie bidoro ịgbara Naịjirịa bọọlụ na 2017. Lee foto ya na enyi ya nwaanyị bụ Obiageli.

6) Elderson Echiejile

Echiejile lụrụ nwunye ya bụ Oghenevwemo n'afọ 2017. Ha mụrụ nwa ha nke mbụ n'ọnwa Maachị 2018.

Ndị egwu etiti

7) John Mikel Obi

Mikel na enyi ya nwaanyị bụ Olga Diyachenko ayịruola ihe ruru afọ ise. Ha mụrụ ụmụnwaanyị abụọ bụ ejima.

8) Onazi Ogenyi

Onazi lụrụ nwunye ya bụ Sandra n'afọ 2015. Ha amụtala otu nwa nwaanyị.

9) Wilfred Ndidi

Ndidi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2015. Ya na enyi ya nwaanyị bụ Chidinma ayịruola afọ abụọ.

10) Oghenekaro Etebo

Etebo bidoro ịgbara Naịjirịa n'afọ 2013. Ya na nwunye ya bụ Isi Ebhota amụtala otu nwa nwoke.

11) Joel Obi

Obi bidoro ịgbara Super Eagles n'afọ 2011. Ya na enyi ya nwaanyị amụtala otu nwa nwoke.

Ndị na-agba n'ihu

12) Odion Ighalo

Ighalo na nwunye ya bụ Sonia, alụọla ọtụtụ afọ. Ha mụtara ụmụ atọ bụ nwoke abụọ na otu nwaanyị.

13) Ahmed Musa

Musa lụrụ Juliet n'afọ 2017 ka ya na nwunye ya nke mbụ na nne ụmụ ya abụọ bụ Jamila gbasara.

14)Victor Moses

Moses lụrụ nwunye ya bụ Josephine n'afọ 2017. Agbamakwụkwọ ya na-abịa ka ha mụchara ụmụ abụọ, otu nwoke nke a mụrụ n'afọ 2012 na nke nwaanyị a mụrụ n'afọ 2015.

Kedụ ndị ọzọ ị ma ụmụnwaanyị nọ na ndụ ha?

Akụkọ ndị ga-amasị gị: