Ras Kimono: Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwafọ Naịjirịa a ma ama na-eti egwu Rege bụ Ukeleke Onwubuya nke e ji aha Ras Kimono anwụọla.

Ugbua, BBC Igbo enweghiike ikwu ma okwu a bụ ezi okwu maọbụ asị makana onweghị ihe ndị ezinaụlọ ya kwuru maka ihe a ugbua.

Onye oti egwu Sound Sultan dere n'elu twitter na Ras Kimono bụ nnukwu mmadụ bụkwara onye udo.

Sinetọ Dino Melaye dere na twitter na ya chetere ụbọchị ya na Ras Kimono mere mmemme n'obodo ya n'ime afọ gara aga.

Ajayi Dami dere na Naịjirịa ka nọ na mgbanwe dịka Ras Kimono kwuru n'egwu ya.

Anyị ga na-ewetara gị akụkọ a ka o si aga.