You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Falz ekwuola na ya agaghị ewepụ egwu #ThisisNigeria
Folarin Falana, onye na-eti egwu ama ama dịka Falz ekwuola na ya agaghị ewepụ ihe nkiri egwu o mepụtara ọhụ.
Ụnyaahụ, otu ndị ụka alakụba nke a kpọrọ MURIC n'aha ịchafụ nyere Falz abalị asaa ka o wepụ ihe nkiri egwu o mepụtara ọhụrụ maọbụ ha agba ya akwụkwọ n'ụlọikpe.
Dịka onyeisi otu ahụ bụ ọkamụta Ishaq Akintola siri kwuo, izi ụmụnwaanyị yi hijab agba egwu bụ ihe mkparị nye okpukperechi Islam.
Mana onye na-ahazị Falz bụ Femisoro Ajayị gwara BBC na ihe na-eme bụ na ndị mmadụ hapụrụ ozi egwu ahụ na-ezi na-achọ igbu onye ziri ozi.
Falz tiri egwu ọ kpọrọ, "ThisisNigeria" nke o gosipụtara ihe ọjọọ na-eme na Naijiria dịka oke ogbugbu mmadụ ndị ọchịehi na-eme, ndị ụkọchukwu ji ndị ụka ha akpa ego na nsogbu ụmụaka nwaanyị ana-atọrọ n'Ugwu-Awusa wdg.
Ka ọ dị ugbua, okwu MURIC kpalitere emela ka egwu Falz na-ewu ebe niile nke na kemgbe o bupụtara ya ka ọnwa Mee dị 25 mmadụ ihe karịrị nde mmadụ anọ( 4 m) ekiriela ya.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Mana dịka ndọrịtaụka na-eme, ọtụtụ ndị na-eto eto kwuru n'igwe Twitter na Falz kwuru ka o siri mee.
Onye kpọrọ onwe ya 'Trump-in-law' kwuru na ´Falz kpọrọ ndị ụkọchụkwụ na ndị otu Kraist; "O metụtara onyeisiala anyị, metụta onyeisi ndị uweojii. Ọ kpọghị onye imam maọbụ onye ụka alakụba.
Maka hijab, ibulia akwụkwọ ngaghariiwe."
Onye ọzọ bụ Tunde Smilez Toheed kọwara na ya bụ onyeụka alakụba kwuru na ndị na-akatọ ihe nkiri ahụ bụ ndị achọghị ka agbasa eziokwu dị na ya.
Ebuka Akara kwuru na okwu okpukperechi ga-ememila Naijiria otu ụbọchị.
Praise Akogun kwuru na nkatọ a katọrọ egwu Falz gosiri na anwụrụ ọkụ eruloa eluigwe nti ma gwakwa ndị chọrọ ịkpụpụ Falz ụlọikpe ka ha cheta na ya na nna bụ Femi Falana bụ ọkaiwu a mara amara.
Ụfọdụ dịka Alldatjas katọrọ Falz maka egwu ya si na ọ na-akpa oke agbụrụ.