E zuru Nwankwo Kanu ohi nde dọlla iri n'otu na mba Rọshịa

Ezuru onye ọgba bọọlụ ama ama bụ Kanu Nwankwo ohi ihe ruru nde dọlla iri n n'otu na ngwụcha izuụka gara aga na mba Rọshịa.

Ụlọ ntaakụkọ Moscow Times kwuru na ọ bụ ebe Kanu na-eme njem site na Moscow ruo Kaliningrad ka esi n'ime akpa ya zuru ego ahụ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ mgbe Kanu ruru Kaliningrad ka ọ chọpụtara na-ezuru ya ohi.

Kanụ gara mba Rọshịa ị sonye n'asọmpị ndị dike n'ọgbaa bọọlụ ga-agba n'ụbọchị ụka ị ji kwado asọmpị iko mba ụwa na mba Rọshịa.

Minista na-ahụ maka ihe gbasara ime mba Rọshịa bụ Vladimir Kolokoltsev kwuputara na anwụchiela ndị ụlọọrụ ọdọ ụgboelu Moscow maka okwu a.

O si "mmadụ abụọ na-ebu ibu na ụgbọelu si London bata Moscow zuru ego n'akpa otu onye njem abaala nwuchi ebe a chọpụtara ha"

Kaliningrad bụ otu n'ime obodo iri n'otu a ga agba asọmpị iko mba ụwa n'ọnwa na Rọshịa.

Akụkọ ga-amasị gị