You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụmụafọ Igbo ga-agba asọmpi Iko Mba Ụwa
Onye nchịkọta ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr akpọọla mmadụ iri abụọ na atọ ga-agba asọmpi Iko Mba Ụwa.
Ọtụtụ n'ime ndị a ahọpụtara ga-agbara Naịjirịa bụ ụmụafọ Igbo ebe ndị a ọzọ si mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
Ụmụafọ Igbo ndị akpọrọ gụnyere ndị na-eche bọọlụ, ndị na-agba ebe azụ, etiti nakwa n'ebe ihu.
Ndị na-eche bọọlụ;
Ikechukwu Ezenwa, Daniel Akpeyi na Francis Uzoho.
Ndị na-agba n'azụ;
Kenneth Omeruo, Chidozie Awaziem, Tyronne Ebuehi mana nne ya bụ onye bekee.
Ndị na-agba n'etiti;
Mikel Obi, John Ogu, Wilfred Ndidi na Joel Obi.
Ndị na-agba n'ihu;
Alex Iwobi, Kelechi Iheanacho, Simeon Nwankwo.
Ndị ọzọ akpọrọ aha bụ William Ekong, Leon Balogun, Bryan Idowu, Abdullahi Shehu, Elderson Echiejile, Ogenyi Onazi, Oghenekaro Etebo, Idion Ighalo, Ahmed Musa na Victor Moses.