England Vs Naịjirịa: Ihe ndị Naịjirịa na-atụ anya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ime nkwado asọmpi Iko Mba Ụwa nke Rọshịa 2018, ndị Super Eagles nke Naịjirịa ga-ezute ndị Three Lions nke England taa.

Super Eagles bụ ndị kachasị obere n'afọ n'ime otu bọọlụ mba ụwa niile na-abịa asọmpi nke Rọshịa 2018.

I ji mee ka ha kwụrụ chịm n'izute otu bọọlụ chere ha n'ihu, ha malitere asọmpi enyi ne enyi bụ ebe ha ga-ezute mba England taa.

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa e gosila nkwado ha n'ebe Super Eagles nọ ma kwuo ihe ha na-atụ anya n'ime asọmpị ahụ.

Ha kwuru nke a site n'akara twitter ha dị iche iche;

Kayode Ogundamisi kwuru na ọ ga-akwado Super eagles imeri agbanyeghi na ọ hụrụ England n'anya.

Richard Moneme kwuru n nkwado enyerela ndị Super Eagles dị ukwuu ya mere ha kwesiri ime nkeọma

Ebuka Obi-Uchendu kwuru na ọ ga ghanyere ndị England aja na garri dịka ọ ga anọ n'ọgbọ egwuregwu Wembly dị na Lọndọn

N'aka nke ọzọ, ndị mba England kwadokwara otu bọọlụ nke ha n'inwe mmeri

Ed Shaw kwuru na England ga-eji ọkpụ ise asatara atọ merie Naịjirịa.