England Vs Naịjirịa: Iwuobi e gosi na ọ bụ nwanne Okocha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'asọmpi enyi na enyi Naịjirịa na England gbara taa Naịjirịa gbaliri ike ha agbanyeghi na e meriri ha.

England ji ọkpụ abụọ asatara otu merie Naịjirịa dịka Garry cahill na Harry Kane nyere ndị goolụ ndị England, Alex Iwobi nyere Naịjirịa goolu.

N'ime asọmpi ahụ ụmụ afọ Naịjirịa gbapụtara ihe bụ Alex Iwobi na Victor Moses maka ihe pụrụiche ha mere.

Iwobi bụ onye gbara bọọlụ nke ọma ma nyere ndị Naịjirịa otu ọkpụ goolu ha nwetere ma bụrụ onye mbụ na-enye mba England goolu na Naịjirịa.

Nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-eto ya maka, kwuo n'ezie na ọ bụ nwanne Austin Okocha gbara bọọlụ n'oge mbụ

Victor Moses kpara Harry Kane ịkpa dị egwu nke mere aka ya na ikpere ji ruo ala ma.

Ịkpa mere ọtụtụ ndị ji na-ekwu na Moses agbajiela Kane ụkwụ n'akara twitter ha.