Ihe mere m ji tee mmanụ n'isi ndị mmadụ - Okorocha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha abaala n'akụkọ ọzọ.

Ugbua, ọ bụ otu foto gosiri ya mgbe o na-ete ndị mmadụ mmanụ n'isi dịka onyeụkọchukwu.

Ọ bụ n'ụlọụka dị n'ime ụlọọkwa ọchịchị ya n'Owere ka ha setera ya bụ foto.

Ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ n'elu social media bụ i họta ihe Okorocha na-eme na foto a?

BBC Igbo gbara onye na-ekwuchiri Okorocha n'ihe gbasara soshal midia bụ Ebere Nzewuji ajụjụ ịmata ihe mere o jiri tụkwasị aka n'isi ndị mmadụ.

Nzewuji kọwara na ọ bụ makana ụbọchị ahụ bụ ubọchị ofufe ite mmanụ n'ụlọụka, onyeụkọchukwu gwara onyeọbụla ka ha tee ndị ọzọ mmanụ, ihe a bụ ihe mere ka Okorocha pụta na foto mgbe o na-ete mmanụ.

Nzewuji kwukwara na ọ dị mgbawa obi na oge ọbụla ndị mmadụ hụrụ Okorocha, ihe ga-apụta n'obi ha bụ ikwu ihe ọjọọ.

Akụkọ ga-amasị gị: