Okorocha esoghi na nzụko ndị isi APC mere n'Abuja

Ka ndị so n'otu pati All Progressives Congress (APC) nke ọwụwa anyanwụ na-agbakọ n'Abuja na atụmatụ ha kpọrọ "South East Zonal Executive Committe" na asụsụ Bekee, bụ nke ha si bụ iji hazie etu ha ga-eji mee ọgbakọ ukwuu nke pati ha, onye na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha kwuru na aka ya adịghi na ya.

Okorocha, dika ọ bụ sosọ ya bụ gọvanọ ndi APC nwere n'ala Igbo bụ onye a na-ahụ ka onyeisi APC n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, sị na ya bụ ọgbakọ ezughi oke ma ya anọghị ya.

Onye gbapere nzukọ a bụ osote onyeisi APC n'ala Igbo bụ Emma Eneuwku, bu onye kwuru na oge Igbo bụ ndị kewara ekewa agala.

Ndị gara nzukọ a gunyere Ken Nnamani, Jim Nwobodo, Orji Kalu, Sullivan Chime, Martins Elechi, Ben Uwajimogu na ndị ọzọ.

Ọnụ na-ekwụchịtere Ọkorocha bụ Sam Onwuemeodo kwuru: Ọbụrụ n'Okorocha nọ na nzụkọ ahu, mara na ọ bụ nke ziri ezi. Mana agaghi enwe nzụkọ ndị nwe APC na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma ya bụru na ya bụ onyeisi Pati n'ebe ahu anọghị ya. Nke a pụtara na ọ bụ oge ka ha na-egbụ."

Cheta na Okorocha na ufọdụ ndị APC na steeti ya na-enwe nsogbu maka ọ chọrọ ka ọgọ ya nwoke banye dị ka aka na-achi Imo steeti ma ya rituo.

Ihe nkiri a na-egosi ihe onye okpa ọchị Uche Ogbuagu kwuru maka njem ya n'ọchịchị Rochas.