Ụmụ Afrịka na-agbara ndị mba ọzọ bọọlụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ka iko mba ụwa na-abịa nso, mba dị icheiche na-etinye aha ndị ga-agara ha asọmpi na Rọshịa, anyị na-etinye anya na ndị nwere ọbara Afrịka nwere ike iso mba ndị ọzọ sọọ mpi.

Bamidele Jermaine Alli (Tottenham Hotspur, England)

Bamidele Jermaine Alli, nke a ma dịka Dele Alli, na-agbara ndị Tottenham Hotspur na otu egwurewgu bọolụ mba England. Nna Alli bụ onye Naịjirịa. N'asọmpị enyi na enyi ndị Naịjirịa na ndị England gbara nso nso a, ụfọdụ ndị Naịjirịa kworo ya ekwo n'ọgbọ egwuregwu, maka na okweghị agbara ndị Naịjirịa bọolụ mgbe akpọrọ ya oku.

N'Golo Kante (France, Mali)

N'Golo Kanté bụ onye na-agbara ndi France bọọlụ ma na-agbakwa bọolụ na Chelsea. O bu ụzọ gba bọọlụ nke ukwuu n'otu egwuregwu Bologne nke France.

Kante gbaara ndị France bọọlụ tupu agbaa Euro 2016, ma gbaara ha bọọlụ n'asọmpi ahụ ka ọ jụrụ ịgbara ndị Mali bọọlụ. Nne na nna Kante si Mali gawa France n'afọ 1980.

Blaise Matuidi (France, Angola)

Blaise Matuidi na-agbara ndị Juventus bọọlụ, ma na-agbakwara otu egwuregwu France bọọlụ dịka onye ọgba n'etiti.

Nne na nna Matuidi si Angola. Ha gara France mgbe Angola nọ n'agha.

Paul Pogba (France, Guinea)

Paul Labile Pogba, na-agbara otu egwuregwu Manchester United na ndị mba France bọọlụ.

Amụrụ Pogba na France mana nne na nna ya bụ ndi Guinea. Ụmụnne ya abụo na-agbakwa bọolụ. Florentin, nke tọchasịri ha, na-agba bọọlụ n'otu egwuregwu Saint-Étienne, nke osote ya na-agbara ndị Sparta Rotterdam nke Holland nakwa otu egwuregwu nke Guinea.

Ụmụ nne ya họtara ịgbara ndị Guinea bọọlụ, mana ọ họtara France.

Gelson Martins (Portugal, Cape Verde)

Gelson Dany Batalha Martins na-agbara otu egwuregwu Sporting CP na ndị Portugal bọọlụ. Ọ na-agba n'akụkụ.

Amụrụ ya na Cape Verde, ma ọ gara Paris mgbe ọ bụ nwatakịrị.

William Carvalho (Portugal, Angola)

William Silva de Carvalho, na-agbara otu egwuregwu Sporting CP na Portugal bọọlụ. Amụrụ Carvalho n'Angola mana ọ gara Portugal mgbe ọ ka bụ nwata. Nna ya ochie na nwanne nna ya gbara bọọlu ọfụma n'Angola.

Presnel Kimpembe (France, Congo)

Presnel Kimpembe na-agba bọọlu n'otu egwuregwu Paris Saint-Germain ma na-agbakwara mba France.

Amụrụ Kimpembe na France mana nne ya bụ onye Haiti ebe nna ya bụ onye Congo.

Benjamin Mendy (France, Senegal)

Mendy na-agabara ndị Manchester City bọọlụ, ma sorokwa n'otu egwuregwu bọọlụ nke France. Nne na nna ya bụ ndị Senegal.

Steve Mandanda (France, Congo DR)

Steve Mandanda, bụ onye nche goolu na-agabara ndị Marseille bọọlụ ma na-agbakwara ndị France.

Amụrụ Mandanda na Kinshasa - nke bụ isi obodo Democratic Republic of Congo - mana ọ bụ mba France ka ọ họtọra ịsọrọ mpi.

Nke mere ụmụnneya jiri na-akpọ ya "Frenchie" makana mmadụ atọ ọ tọrọ na-agabara ndị Congo bọọlụ.

Antonio Rudiger (Germany, Sierra Leone)

Nna Antonio Rüdiger bu onye Germany mana nne ya bụ onye Sierra Leone. Ọ na-agbara ndị otu Chelsea nakwa Germany bọọlụ.

Sahr Senesie gbachitere Germany nakwa Borussia Dortmund bọọlụ bụ nwanne ya.

Romelu Lukaku (Belgium, Congo DR)Romelu Menama Lukaku Bolingoli, na-agbara ndị Manchester United na otu egwuregwu mba Belgium bọọlụ.

Amụrụ Lukaku na Belgium mana nne na nna ya bụ ndi Congo. Nna ya bụ Roger Lukaku gbaara otu egwuregwu ndị Congo (mgbe a ka na-akpọ ya Zaire).

Nabil Fekir (France, Algeria)Nabil Fekir na-agbara ndị Lyon na otu egwuregwu France bọolụ.

Ndị Algeria, bụ mba nne na nna ya si, kpọrọ Fekir ka ọ gbaara ha bọolụ n'afọ 2015 mana okweghị.

Kylian Mbappe (France, Cameroon)Kylian Mbappé Lottin bụ onye egwu ndị Paris Saint-Germain na mba France.

Amụrụ Mbappé na Paris, nna ya bụ onye Cameroon ebe nne ya si Algeria. Nne ya kuburu bọọlụ aka.

Jerome Boateng (Germany, Ghana)

Jérôme Agyenim Boateng na-agba n'azụ na Bayern Munich ma bụrụkwa onye otu egwuregwu ndị Germany.

Amụrụ Jérôme Agyenim Boateng na Germany mana nna ya bụ onye Ghana.

Ebe nwanne ya bụ Kevin-Prince Boateng, na-agbachitere ndị Ghana.