You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe asaa nwoke Igbo chọrọ na nwaanyị ọ ga-alụ
A gbacha alabanko, oru oge ịlụ nwaanyị, nwoke bụ nwa afọ Igbo na-etinye anya na mmiri ịhọrọ nwaanyị ọ ga edulara nne ya.
BBC Igbo na ụmụnwoke Igbo agba ọhụrụ ụfọdụ nwere mkparịtaụka banyere ihe ndị ha chọrọ na nwaanyị ha ga-alụ.
Lee okwu gbara ọkpụrụkpụ pụtara ugboro ugboro n'ihe ha kwuru:
1. Nkwanye ugwu
Ọtụmadị ka nwoke Igbo nwere mmasị ebe nwaanyị chara anya dị, ọ chọghị nwaanyị ya na ya ga-na-azọ isi ezinaụlọ ya.
Nwa afọ Igbo chọrọ nwaanyị ga-akwanyere ya ugwu n'ime ụlọ ma na mbara, kwanyere nne na nna ya na ndị ezinaụlọ ya ugwu site n'okwu na omume.
2. Ezi agwa
Ilu Igbo na-ekwụ sị, 'Ezi agwa ka ego'. Nwoke bụ nwa afọ na-akwado ịlụ nwaanyị, otu n'ime ihe ọ na-ajụ banyere onye ọ ga-alụ bụ o nwekwara ezi omume? Ọ bụkwa nwata nwaanyị a zụrụ azụ?
Dịka otu nwa afọ a kpọrọ Emeka Ejere si kọwaa ya, ihe e jiri mara nwaagbọghọ nwere ezi agwa na "ọ na-erube isi; mara ihe kwesịrị ime na mgbe e kwesịrị ime ya; na-ekele ekene ma na-anabatakwa ekele nke mmadụ".
3. Ntụkwasị obi
Otu n'ime ihe dịkachasịrị nwoke Igbo chọrọ nwaanyị mkpa bụ nwanyị ọ ga-atụkwasị obi.
Nwaanyị na-agba n'ezi bụ ajọọ ahịa onweghị nwoke Igbo ọ ga-amasị ịzụ.
4. Nwaanyị na-adị ọcha
Nwoke agbọ ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị na-adị ọcha ma na-edobekwa gburugburu ya ọcha.
Nwaanyị na-erụ unyi bụ agbawa-aghara ebe ndị ụmụokoroọbịa nọ.
5 Nwaanyị gụrụ akwụkwọ/na-agba mbọ
Obodo bụ igwe ugbua n'ala anyị. Onye agbasighị ike agaghị azọta onwe ya n'ihi na akụnaụba ala anyị na-agba egwu 'onye-chụta-o-rie.'
Nke a mere na ọtụtụ okorobia Igbo dịka Chinedu Uzoegbu na-achọzị ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ maọbụ onye nwe ezi aka ọrụ - nwanyị na-agba mbọ.
Uzoegbu gwara BBC, "A chọrọ m nwaanyị gụrụ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ gụghị akwụkwọ ọ ga-adị nnjikere ịgụ akwụkwọ."
Dịka ihe siri kwụrụ ugbua, ọ bụsị onye weta, ibe ya eweta.
Oge nwaanyị ga-adịka 'Oriaku' aga-ala!
6 Nwaanyị nwere ọgụgụ isi
Nwoke agba ọhụrụ chọrọ nwaanyị ma ihe, onye ya na ya ga na-atụkọ alọ maka ọganihu ezinaụlọ ha.
7. Nwaanyị mara mma
E tere ogiri, etere ụgba, nwaokorobịa agba ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị mara mma.
Dịka Nonso Akosa si kwuo ya, "onye ị ga-akpọ gaa ihe."