NIgeria VS Libya: Super Eagles agwọọla Libya ịba

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Obi atọgbuola ndị Super Eagles maka mmeri a meri otu Libya n'asọmpị ịhọpụta ndị ga-eso n'asọmpị ''Africa Cup of Nations'' .

Ha meri mba Libya ọkpụ anọ asatara ihe n'ọdọ egwuregwu Godswill Akpabio n'Uyo. isi obodo Akwa Ibom steeti.

Ọ bụ Odion Ighalo nyere goolu atọ n'ime asọmpị a, Samuel Kalu bụ onye nyere goolu nke anọ.

Ọtụtụ mmadụ na-eto aha ha na social media maka mmeri a.

Ha na-ekwu na Super Eagles ejiila ihe mere n'iko mba ụwa na Roshịa mụta ihe.

‏@akinlatauto dere na Samuel Kalu bụ onye ga-anọchịte Victor Moses anya n'otu ahụ

@SharmySamuel kọwara ebe Naijirịa nọrọ ugbua n'asọmpị a.

Mana ọtụtu ndị mmadụ ọzọ na-ekwu na ọ ga-afịa Super Eagles ahụ ị me nke ọma ma ha bata n'asọmpi AFCON n'ezi e.

Akụkọ ndị ga-amasị gị