You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Victor Moses dị afọ 27 alaala ezumike nka n'egwuregwu bọọlụ Naijiria
Victor Moses ọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ ọzọ ma a kpọkuo ya?
Ka Moses kwuputara na Twitter na ọ wụsala boot o ji agbara Naịjirịa bọọlụ, ọ bụrụla ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.
Moses dị afọ 27, gbaara Naịjirịa bọọlụ ugboro 37 ma nye goolu ugboro 12, n'agbanyeghị na o bu ụzọ gbaara Ịngland na ngalaba U-21.
Iji kwuputa maka 'boot' ọ wụsara, Moses dere sị "ọtụtụ ihe ọma merela na ndụ m mere ka m yi uwe ndị Super Eagles, agaghị m echefu ya na ndụ m niile.
"Mana ugbua bụ oge kacha mma iji lekọta ezinaụlọ m nakwa klụb ebe bụ ụlọọrụ m, nakwa inye ndị na-etolite ohere iji pụta n'ọgbọ mee ọfụma.
"Daalụ maka ihe niile, ya gaziere otu a n'ọdịniihu."
Cheta na Moses so Naịjirịa bulie Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, ma sorokwa ha gaa Iko Mbaụwa abụọ n'afọ 2014 na nke 2018.
Moses nyere goolu abụọ n'asọmpi Iko mpaghara Afrịka n'afọ 2013, nke nyere Naịjirịa ikike iji gafee agba mgbapụ.
O nyekwara otu goolu ka Naịjirịa na Ajentina zukọrọ n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa na 2018.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị