Regina Pacis Onitsha: Ụlọakwụkwọ ahụ bụzị ebe a na-agba nkiri.

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mgbe BBC Igbo rutere na ya bụ ụlọ akwụkwọ ndị ụka katọlịk dị na n'onitsha, ụmụakwụkwọ juru ebe ahụ na-agụkwa akwụkwọ a na-achịkọba oge ezumike.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ bụ maazị Ken Nwoye kọwara na obi dị ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ niile ụtọ maka nturu ugo umu aka ise ahụ.

Nwoye kọwara na ụmụ aka ụmụnwaanyị ise ahụ nọ n'agbata afọ iri na atọ nakwa iri na ise, ma nọrọkwa na klaasị SS1.

O kwuru na ụmụaka ahụ rụpụtara akụrụngwa ahụ, a na-akpọ 'FD Detector' ma ọ bụ "Fake drug Detector' n'olu Bekee.

Nke a pụtara na akụrụngwa ahụ pụrụ igbochi mkpamkpa ọgwụ adịgboroja na-akpa na Naijịria.

O kwuru na ya bụ FD detector bụ nke ndị ụlọ orụ NAFDAC nabatagoro.

Ndị ya na Regina Pacis zọrọ ya bụ asọmpi bụ ụlọakwụkwọ si mba 115 n'uwa niile bịa, ha tukwara ugo dịka ndị mbụ.

Aha ya bụ asọ mpi bụ World Technovation Challenge nke e mere na San Francisco na US.

Ụmụaka turu ugo a bụ, Promise Nnalue, Jessica Osita, Nwabuaku Ossai, Adaeze Onuigbo na Vivian Okoye.

Iji kwanyere ụmụaka ahụ ugwu, onye commisioner na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Anambara steeti kwuru na ya ga na-eyị uwe akwụkwọ Regina Pacis aga ọrụ ruo otu ọnwa.

O bidoro nkwa a o kwere site n'iyi ya bụ uwe gaa ọrụ ụnyaahụ.

Onyeisiala ụlọakwụkwọ ahụ ụkọchukwu Fada Vincent Ezeaka ka dukwa ya bụ ụmụ aka nọrọ na mba Amerịka ebe ha na -kwadozị ịlọtawa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: