You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Technovation : Osinbajo ekelela ụmụaka Igbo turula ugo ọkaibe n'asompi technụzụ
Otu a kpọrọ Save-A-Soul nọchitere Naijirịa n'asompi a kpọrọ 'Technovation' aburula ọkaibe n'ụwa niile.
Ụmụada ise a si n'Anambara steeti ji teknụzụ ekwentị a kpọrọ, 'FD Detector,' ha mepụtara iji buso nsogbu ọgwụ adigboroja ọgụ n'ala Naijiria, were turu ugo dịka ọka ibe nke bụ asompi ụmụaka ụmụnwaanyị na-eto eto ndị na-emepụta teknụzụ na mba ụwa.
Aha ụmụaka isi na-acha ọkụ bụ; Adaeze Onuigbo, Jessica Osita, Promise Nnalue, Nwabụakụ Ossai, nakwa Vivian Okoye sị Regina Pacies Secondary School, Onicha.
Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala Naijiria bụ Yemi Osibanjo ekelela ụmụaka na igwe okwu sị ha na ha gbalịrị.
Osinbajo Kelegbara Uchenna Onwuamaegbu-Ugwu bụ onye nchịkọta Edufun Technik STEM Center, onye zulitere ụmụaka ahụ na nkanaụzu maka ịkwado ha.
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-egosi obi ụtọ ha n'ihe a mere.
Fadahunsi Sefunmi gosiri ọṅụ na "ụmụaka ụmụnwaanyị emeriela!"
Ayo kwuru na ha kwesiri ekele
Osita Nwegu sịrị ha ndewoo.