Nickelodeon Kids Choice Awards 2021: Ugo Emmanuella achakeela ọzọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọọrụ Nickelodeon ewepụtala aha ndị ha ga-etunye ugo 'Nickelodeon Kids Choice Awards(KCA) n'afọ 2021 a.

Ndị aha ha so na ya bụ ndekọ nturugo gunyere Ikorodu Bois, Emmanuella, Elsa Majimbo, Bonang Matheba, Mo Salah, Master KG plus GhettoKids nakwa ndị ọzọ.

Ndọrọndọrọ nturugo a ga-ata akpụ makana ọtụtụ n'ime ndị a bụcha ọkaibe n'elu soshal midia ma nwe ọtụtụ mmadụ ha na-akpalite mmụọ ha na-eso ha n'ebe ahụ.

Onye na-eme ihe nkiri, ọkpachị nakwa onye tuburu ugo a bụ Kenan Thompson, ga-ahazi mmemme ahụ n'ụbọchị March 15, 2021.

Ndị nso nso ha nwereike itunyere ha vootu na twitter, KidsChoiceAwards.com, nakwa app na-arụ ọrụ n'igwe ipad, iphone nakwa android na mba U.S.

Emmanuella nakwa Ikorodu Bois so na ndị ama ama na Naịjirịa ahọpụtara n'ogo "Favourite African Social Media Star" , ndị ọzọ nọ n'ogo a si mba Kenya.

Ọ bụghị sọọsọ nne m ka m wurula ụlọ a, nna m so - Ọkpaọchị Emmanuella

Ọtụtụ ndị ama ama bụ ụkpa ekele ebunye ọkpaọchị Emmanuella dịka ọ rụtara nne ya ụlọ.

Ọkpaọchị a dị afọ iri wepụtara foto ụlọ ọhụrụ ọ rụrụ nne ya n'ụbọchị Fraịde.

N'okwu ya, ´a rụrụ m nne m ụlọ a , maka ekpere, nkwado, ọ na-enye m. Nne m, a ma m na ịchọrọ ụlọ dị pichọ pịchọ, lee ya ebe a.

"Mana gbaghara m makana m ga-arụcharịrị gị ụlọ ukwu gị n'afọ na-abịanụ."

Nne Emmanuella egbughị oge n'igosi oke ọnụ ya dịka ọ nọ na-elegharị anya n'ụlọ ahụ e doziri nke ọma.

Lee ihe ise ị na maghị maka Emmanuella

Nwata nwanyị bụ Emmanuella Samuel bụ onye a ga-eji maatụ ilu sị na 'nwata kwọ aka, o soro okenye rie nri'.

Akụkọ n'ekwụ na ọ banyere ihe onyonyo ndị Walt Disney na Hollywood. Ọ sị na-ịme ihe na-akpa ọchị n'onyonyo we rue ebe ahụ.

Ka ude ya n'ede, anyị ga-ewetara gị ịhe ise ị maghị maka nwata nwanyị a pụrụ ịche.

Amụrụ ya n'afọ 2010

Emmanuella bụ nwa afọ Imo steetị amụrụ n'bodo PortHacourt na Rivers steeti:

Ọ ga-agba afọ asatọ n'ọnwa Julai:

N'agbanyeghị afọ ya, o ritela ntuliugo asaa maka ime ihe na-akpa ọchị.

Nwanne ya nwoke bụ onye akpaọchị amaama:

Ọ bụ n'elu ọkwa nwanne ya bụ 'Mark Angel Comedy' ka o si bido ịmepụta ịhe ọchị nke ya.

O ritela ezigbo ego!

Akụkọ kwuru na Emmanuella eritela ego ruru nde naira iri abụọ n'ise.

Ihe onyonyo njiri mara ya bụ 'My Real Face'

Lee kwa ya eba:

Onyeịsị ụlọ omeiwu Sinetị bụ Bukola Saraki ezịgara la ya ozi ya bịa n'ụlọọrụ Sineti nara nkwanye ugwu.