You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
A kpọdoro ụmụakwụkwọ n'elu obe n'Ogun steeti
Ndị uweojii nwụchịrị Afolayan Joseph bụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ e kechiri ụmụakwụkwọ abụọ n'obe ma na-apịa ha ụtarị makana ha abịaghị akwụkwọ n'ọge.
Ndị nkụzi abụọ si n'ụlọakwụkwọ ahu akpọrọ Metorite Standard School dị n'obodo Ayetoro nke n'Ogun steeti sokwa na ndị aka ji maka ịhe a mere ụmụaka n'ụtụtụ ụnyaahụ
Dịka ụlọ ntaakụkọ Punch siri kwuo, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ wakporo otu onye uweojii a kpọrọ Livinus ka ọ na-achọ ị tọghapụ ụmụaka ahụ.
Livinus na ụfọdụ ndị agabtobi mechara tọghapụ ụmụaka ahụ ma kpọ kwa ndị uweojii ibe ya. Ka ndi uweojii a bịara ha nwụchịrị ndịọrụ ụlọakwụkwọ ahụ.
Onye na-ekwuchite ọnụ ndịuweojii n'Ogun steeti bụ Abimbola Oyeyemi kọwara BBC Igbo n'ekwentị na anwụchiela ndị ahụ.
Oyeyemi kwuru na ndị ọrụ ụlọakụkwọ ahụ mefere ihe oke n'ịkpodo ụmụakwụkwọ nelu obe.
N'onu ya, "ihe ha mere jogburu onwe ya, anyị agaghị anabata ya, anyị ga-eme nyocha zuru oke ma kpụpụ ha ụlọịkpe"
Ndị mmadụ n'ekwu n'elu igwe okwu maka ahụhụ dị ịcheịche n'ụlọakụkwọ sekondrị:
@knoxpete gosiri ụdị ahụhụ ọ tara n'ụlọakwụkwọ sekondrị
Ebe @Xcel_101 kwuru maka oke ụtarị apịara ya n'ụlọakwụkwọ