You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ahmed Musa: Otu Al Nasr anabatala ya taa
Otu onye ndị mmadụ chere na ọ ga-abanye otu egwuregwu bọọlụ gbalitere n'ọkwa bụ Ahmed Musa.
Mana ugbua, Musa kpara mkpamkpa n'asọmpi Iko Mbaụwa gwụrụ agwụ esila n'otu Leicester City gafee n'otu Al Nasr nke Saudi Arebia.
Amabeghị ego ole ha jiri zụọ ya n'aka ndị Leicester City mana a na-anụ kepu kepu na o ruru nde pounds iri na asaa na ọkara.
Leicester City zụrụ ya mbụ n'aka otu CSKA Moscow n'afọ 2016 mana ọ laghachịrị ebe ahụ n'oge bọọlụ nke afọ 2017 gara aga.
Ka agbachara Iko Mbaụwa, ndị mmadu chere na ọ ga-aga Galatasaray maka na ndị na-akwado otu egwuregwu ahụ kpọrọ ya oku nke ukwuu.
Ihe onyonyo dị n'elu na-egosi etu otu ọhụrụ ya siri sị ya "nnọọ" ma nabata ya n'ime otu ha.
Ka ọ dị ugbua, Ahmed Musa ekwubeghi ihe ọbụla maka okwu a na-ewu ewu.