You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị Super Eagles dịzị ka nwunye ọhụrụ a chọrọ ịlụ
Iko mbaụwa bụ emume kachasị nwe ugwu n'egwụregwụ bọọlụ n'ụwa niile, ma bụkwara ebe ndị ọgba bọọlụ na-egosi akaraka ha i ji nweta ọganihu pụrụiche.
Agbanyeghi na Naịjirịa apụọla n'asọmpi a, ndị egwuregwu Naịjirịa abụọ nwetere ezigbo ugwu nke mere aha ha ji na-ada ụda na soshal midia.
Mmadu abụọ n'ime ndị a bụ Ahmed Musa na Etebo Oghenekaro.
Etebo dere n'akara Twitter ya na asọmpi ndị Super Eagles na Ajentina gbara bu nke kachasị siere ya ike kemgbe o bidoro egwuregwu bọọlụ.
Nke mere ndi mmadu jiri nye ya ezigbote ekele.
Dika Nnamdi Mbonu kwuru na etu nwaamadị a si gbaa bọọlụ pụrụiche ma kwukwa na ọtụtụ ndị Naịjirịa kwenyere na ihe a okwuru.
Mana, Alan Shore nwere akara Twitter @Lawyerchap si na ọ dị ya ka Etebo omere ngwa ngwa mgbe ọ gara binye aka n'otu egwuregwu bọọlụ Stoke City. Ma juọ ma ọ ga aka mma
ma ọ bụrụ na o mere etu a ka agbachara Iko Mbaụwa.
Onye nwere akara @Tslamdr si na ọ bụ ihe o ma na ọ gara Stoke City, maka na ya mee nke ọma, ndi ọzọ ga-azụrụ ya ngwa ngwa.
Onye nkwado Stoke City bụ Liam Clowes kwenyere n'ihe @Tslamdr kwuru maka na ọ sịrị na Etebo ga-enyere ha aka banye Champịọns League.
@Chris26Hughes si na Etebo mere ọfuma n'iko Mbaụwa, nke mere ya na-eche ịhụ ya na Stoke City.
Mana, ka ndị na-akwado Stoke City na-enwe aṅụrị maka Etebo, ndị Galatasaray na-akpo Ahmed Musa ka ọ bịa bụrụ onye otu bọọlụ ha.
Musa dere na ọ na-ekele ndị niile nyere ya nkwado ma Chukwu nyere ya ohere ị ga Iko Mbaụwa.
Dịka ndị mmadụ ka na-ezigara ya ozi ekele pụrụiche, ndị nkwado Galatasaray bụ otu egwuregwu dị na Tọọkị webatara ozi n'akara Twitter ya, sị ya bịawa otu ha.
Amabeghị ma Musa ọ ga aza oku a, mana o gosiri na ọ bụ onye eji aga ọgụ n'Iko Mbaụwa.