You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup 2018: Ụmụ Naịjirịa sị Ahmed Musa bịa bụrụ onyeisiala
Ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ekele ndị Super Eagles n'elu soshal midia maka mmeri ha meri Aịsland ụnyahụ na n'iko mba ụwa, mana onye akpụ n'ọnụ bu nwaafọ Ahmed Musa.
Musa bụ onye nyere ọkpụ abụọ ha ji nwe merie Aịsland n'asọmpị ha gbara ụnyaahụ.
Musa, na-agba bọọlụ na CSK Moskow nke Rọshịa na mbinye site n'aka Leicester City nke mba Briten, gbara mbọ ka onye hụrụ asọmpị ahụ ka ihe ọnwụ na ndụ ịhu na Naịjirịa nwetara mmeri.
Ka ndi dị ka onyeisi ndị omeiwu Naijirịa bụ Bukola Saraki na ekele ndi Super Eagles na ha mere nke ọma:
Ụfọdụ umu Naịjirịa dịka Leke Yusuf na Adeniyi Boluwatife kwuru na onweghị ihe ọzọ karịrị ka Ahmed Musa bịa bụrụ onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019.
Mana, ka nke ndị Naịjirịa na-ekwu nwere ike ọgaghị atụ ndi mmadụ n'anya maka na ọ bụ ụmụ ha ka a na-ekwu okwu ha, onye a sị mba ọzọ aha ya bụ Shubham Borade sokwa na-ekele Ahmed Musa na ndị Super Eagles maka mmeri ha taa, ọkachasịrị maka ọ rịọrọ ha arịrọ ka ha nwe mmerị "maka Messi".
Ekele a rukwara Musa na akara ya na Instagram, ebe ihunanya wasara ya nke ukwuu.
Musa dere "Taa bụ ya o", nwere tinye akara anya mmiri, ndi were saa ya etu a:
Ka Naịjirịa ga-ezute Ajentina n'ụbọchi Tuesde nke izuụka na-abịa anya niile ga-adịkwa n'ụkwụ vam vam Musa. Enwere ike si ya chiwa ụwa ma Naịjirị gba Ajentina ọkpu atọ asataghị, mana ọ bụ ya bụ ihe agara ime n'iko mbaụwa - ị bu ndị na achị ụwa n'egwuregwu bọọlụ :).
Na onwe, Musa na enye ndị Naịjirịa ekele maka ekele ndị na eru ya aka, mana ọ sịkwa na ọbụghị sọsọ ya pụtara n'ọgbọ, si ka ekene rụọ aka ndị otu ya.
Akụkọ ga-amasị gị: