Leicester City erela Ahmed Musa na mbinye

Onye na-agbara Leicester City bọọlụ bụ Ahmed Musa agafela otu CSKA Moscow na mbinye rue mgbe afọ egwuregwu ga-agwụ

Nwafọ Naịjirịa dị afọ iri abụọ na ise bụ onye ndị leicester zụrụ n'ọnwa Julaị n'afọ 2016 n'ọnụ ego dị £16m.

Ọgbalịrị ike ya ịpụta ihe na Leicester City ebe onyere nanị ọkpụ goolu ise n'asọmpi iri atọ na isii.

Ndị CSKA Moscow kwuru na Musa ga-eso ha gba asọmpi ọdịnala ha n'akwa nke Europa.