Lee ndị mụrụ ndị Super Eagles ebe a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụwa niile jugodu gị, ọ ga-ara ahụ nne na nna gị ịhapụ gị. Ndị otu Super Eagles ma nke a, ya mere ha ji a naghị eji ndị mụrụ ha egwu egwu.

Site na ndụmọdụ mmadụ nwere ike inye onye ọ hụrụ n'anya, ndị mụrụ ndị Super Eagles akwadola ha n'ụzọ pụrụ iche mere ha ji nwee ike ịnọchite anya Naịjirịa n'asọmpi egwuregwu bọọlụ.

Ị hụtụla nne na nna mụrụ ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ a?

BBC Igbo ga-egosi gi ha. Ngwa gụrụ gbadaa.

Kenneth Omeruo

Nne na nna Omeruo bụ "ihe niile" nye ya. Ụjọ anaghị atụ ya igosi nke a.

N'ụbọchị ndị nne nke afọ 2018 a, Omeruo gonyere nne ya ụgbọala iji gosi ya ịhụnanya o nwere ebe ọ nọ.

Elderson Echiejile

Echiejile anaghị eji nne ya egwu egwu. O kwuru sị "okwu nkịtị ezughị ịkọwacha ya...A hụrụ m gị n'anya".

Leon Balogun

Nne na nna Balogun mụtara ụmụ atọ (nwoke abụọ na otu nwaanyị) nke Leon bụ nwa nke abụọ. Nna ya bụ onye Naịjirịa ebe nne ya bụ onye Jamini.

A mụrụ Balogun na Jamini ebe o tokwara.

Bryan Idowu

Nna Idowu bụ onye Naịjirịa, bụ onye Yoruba. Nne nne ya bụ onye Rọshịa, ebe nna nne ya bụ onye Naịjirịa si ala Igbo. Idowu na-asụkwa asụsụ ndị Rọshịa ọfụma.

John Ogu

Ogu na nne ya yiri onwe ha ọfụma. Ọ naghịkwa eji nne ya egwu egwu. O kwuru na nne ya bụ 'ndụ' ya.

Nna ya bụkwa ezigbo enyi ya.

Abdullahi Shehu

Naanị nne Shehu bụ onye o nwere ugbua makana nna ya nwụrụ n'afọ 2015.

Wilfred Ndidi

Ndidi anaghị eji nne ya egwu egwu, mana ndị ọzọ ọ naghị eji egwu egwu bụ Theo van Vlierden na nwunye ya bụ Marleen.

Ha bụ ndị o jiri mere nne na nna site n'oge ọ gafere mba Beljiụm oge ọ dị afọ 17.

Oghenekaro Etebo

Etebo kwuru na nne ya bụ nne kachasị mma n'ụwa niile. O jighi nne ya egwu egwu.

Odion Ighalo

Ighalo na nne ya yiri onwe ha. Nna ya nwụrụ n'afọ 2016.

Ahmed Musa

Musa kwuru na enweghị onye dị ka nne ya n'ụwa. Ọ naghị eji nne ya egwu egwu. Nna ya nwụrụ oge o bụ nwatakịrị.

Alexander Iwobi

Nna Iwobi na Austin Okocha bụ nwanne. Ịgba bọọlụ ọ dị n'ọbara ha?

Enweghị ihe dị ka nne na nna na ndụ mmadụ. Ị kwenyere na nke a?