#NoBraDay: Ọ ga-akwụsị ọrịa kansa n'ụmụnwanyị?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Twitter na Instagram gbara ọkụ taa bụ ụbọchị iri na atọ n'ime ọnwa Ọktoba makana ọ bụ ụbọchị ncheta ihe akpọrọ #NoBraDay na Bekee.

#NoBraDay bụ ụbọchị eji a dọ ụmụnwanyị aka na ntị ka ha nyocha ara ha ọfụma maka ịchọpụta ọrịa kansa na mbido ya.

Ngalaba na-ahụ maka ahụ ike na ụwa niile akpọrọ WHO n'aha ichafu dere na ụmụnwanyị ruru otu nde 1.8 bụ ndị nwere ọrịa kansa n'afọ 2012.

N'ime akwụkwọ ozi ha zipuru, ha kwọwara na ụbọchị a abụghị maka ị hụ ụmụnwayị na-egosi ara ha.

Mana na twitter na Instagram, ụmụnwoke dị afọ dị iche iche pụtara ịkiri foto ara ụmụnwanyị.

Lee ihe @nwokeabiaCHAMP dere oge ọ nụrụ na ụbọchị akụkọ a bụ #NoBraDay.

Mana ọtụtụ mmadụ ghọtara ihe mere ncheta ụbọchị a jiri dị mkpa.

Dịka ka @samCode si kọwa #NoBraDay bụ ụbọchị icheta nakwa ị mụta ihe niile gbasara ọrịa kansa na-eme ụmụnwanyị na ara.

N'ime ozi @reine_toyosii dere o kwuru na ọ bụ ọrịa a gburu nne ya.

Onye ọzọ bụ @D_Mezzenger dekwara na ọ bụ ọrịa kansa gburu nne ya.

Onye ọzọ bụ Gerald Okpara zipuru ozi ya na-arịọ ụmụnwanyị ka ha gba mgbọ hụ na ọrịa kansa abaghị ha n'ahụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị