You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
FIBA Women's World Cup: Ụmụnwaanyị Igbo mere ihe ụmụnwoke emenwughi
Ụmụnwaanyị Naịjirịa agefeela agba ụmụnwoke na-erubeghi n'asọmpi Iko Mbaụwa nke egwuregwu bọọlụnkata.
Ụmụnwaanyị Igbo so n'otu 12 gara ịnọchite anya Naịjiria na ya bụ asọmpi ruru mmadụ asatọ.
Otu ha ama dịka D'Tigress, metara ihe e ji kpụrụ ha n'ọnụ site n'ịbụ mba Afrịka mbụ ga-enweta mmeri ugboro atọ n'egwuregwu n'asọmpi Iko Mbaụwa nke bọọlụnkata ụmụnwaanyị.
Ha bụkwa mba Afrịka mbụ na-eru agba anọ nke ikpeazụ (quarterfinals) n'asọmpi bọọlụnkata ụmụnwaanyị.
Ụmụ Igbo nọ n'otu a
1) Promise Amukamara
Nwaada a na-eji ịtụ bọolụnkata akpata ego n'otu Phoenix Mercury dị na mba Amerịka.
2) Ezinne Kalu
Nwaada a na-emepụtakwa ma na-ere ngwa e ji achọ mma nke Bekee kpọrọ 'cosmetics'.
Ọ na-eji ịtụ bọọlụnkata akpata ego n'otu Vasas Akademia dị na mba Hungary.
3) Cecilia Okoye
Nwaada a bụkwa onye na-ese ihe osise a kpọrọ 'artist' na Bekee.
Ọ na-atụ bọolụnkata n'otu PBC Tirana dị na mba Albania, ebe ọ na-eji ya akpa ego.
4) Nkem Akaraiwe
Nwaada a na-eji ịtụ bọọlụnkata akpata ego n'otu First Bank Basketball Club dị na Naịjirịa.
5) Nkechi Akashili
Nwaada a na-eji ịtụ bọọlụnkata akpata ego n'otu First Bank Basketball Club dị na Naịjirịa.
6) Adaora Elonu
Nwaada a na-eji ịtụ bọọlụ akpata ego n'otu Perfumerias Avenida Salamanca dị na mba Spain.
7) Sara Ogoke-Ejiogu
Nwaada a na-eji ịtụ bọolụnkata akpata ego n'otu Celta Baloncesto Vigo dị na mba Spain.
Ọ bụkwa ihe Bekee kpọrọ 'model'.
8)Jasmine Nwajei
Nwaada a ka gụchara akwụkwọ na mahadum Syracuse dị na mba Amerịka ebe ọ nọkwa na-atụ bọọlụnkata tupu Naịjirịa a kpọrọ ya.