You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụmụnwaanyị Igbo bụ 'olu gbajie boys'
Igbo ndị ọma, ọbụghị ihe ọhụrụ na asa ndị Igbo bụ ndị ama ama mara mma pụrụiche n'elu ụwa niile.
Ha na-egosi kwa akọnauche ha n'ihe dị icheiche dịka ihe onyonyo, ịgụ egwu, na egwuregwu.
Ya mere na ọbụghị ihe ịtụanya na onye meriri "Miss Nigeria" n'afọ 2018 bụ Anita Ukah, nwaada Igbo.
Lee kwa ụmụ asa Igbo n'ọnụọgụgụ ha.
1. Chidinma Ekile
Onye otiegwu ama ama, Chidinma bụ onye ọtụtụ ụmụnwoke na-achọ ime enyi maọbụ kpọgara nne na nna ha.
Olu egwu ya bụ nke na-amasị mmadụ niile nke ọma. Abịa na mma, o ji ya kpọm kwem.
2. Yvonne Orji
Nwaada Igbo nne na nna ya mụrụ na Naịjirịa tupu ọ gafee mba Amerịka, a ma Yvonne Orji na mbaụwa niile maka ihe onyonyo ọ na-eme nke akpọrọ 'Insecure'.
Gụnyere na ọ bụ nwaada mma ya na-egbuke egbuke, ọ na-emekwa ihe ọchị mgbe ụfọdụ.
3. Ebube Nwagbo
Ebube bụ otu nwaada ụmụnwoke ga-enye otu aka na ụkwụ ịnọ n'akụkụ ya.
N'agbanyeghị na ọ na-eme ihe onyonyo na Nollywood, ọ bụ nwaada na-agba mbọ: ọ nwere ọdọ ahịa nke ya ebe ọ na-ere akwa.
4. Uzoamaka Aduba
Ọ dịka ọ bụzị ihe onyonyo ka e ji mara ụmụagbọghọ ndị Igbo o.
Uzo Aduba bụ onye ọzọ ama ama na-eme ihe onyonyo. A mụrụ ya na mba Amerịka.
Uzo bụ otu onye anaghị ezo ezo na ọ bụ onye Naịjirịa nakwa onye Igbo.
5. Ụmụakwụkwọ Regina Pacis, Ọnịcha
Ụmụakwụkwọ ahụ gụnyere Promise Nnalue, Jessica Osita, Nwanuaku Ossai, Adaeze Onuigbo na Vivian Okoye mere ihe mba ndị ọzọ emeghị n'asọmpị Technovation ha gara na Silicon Valley.
Ọ bụghị naanị na ha meriri ya bụ asọmpi, teknụzụ ha mepụtara mere ka aha Naịjirịa wuo n'ụwa nille nke kpatara na ha na-ewu ewu ugbua.
Ha bụ "olu gbajie ma nwoke ma nwaanyị" maka na ụbụrụ ha dị ọkụ.
6. Lotachukwu Ugwu
Rue ugbua, ndị mmadụ ka kpụ okwu uwe Lota yiri gaa nturugo AMVCA nke afọ 2018 n'ọnụ.
Ọ bụ ome ihe onyonyo ọhụrụ ka na-apụta apụta mana ụmụnwoke na-achọ ihu ya maka na Lota bụkwa osite 'special'!
7. Joyce Ekworomadu
A bịa n'egwuregwu, ụmụada Igbo ka na-achị ndị ọzọ.
Otu n'ime ha bụ Joyce Ekworomadu bụ onye egwuregwu bọọlụ nkata. Ọ na-agbara Naịjirịa bọọlụ ma na-akuzikwara ndị ọzọ ya bụ bọọlụ nkata.
A mụrụ ya na mba Amerịka mana onweghi onye a ga-eji tụnyere ya na bọọlụ nkata.
8. Rita Dominic
Rita Dominic bụ aha ama ama na Nollywood niile. Ọcha ya bụ nke na-aba onye ọbụla n'anya.
Ọ na-eme ihe onyonyo nke ọma nke mere na ụfọdụ ụmụnwoke nwereike ịgbahapụ nwunye ha ma o kwe na ọ ga-alụ ha.
9. Rachel Okonkwo
Onweghị onye Igbo ma n'ala Igbo ma na mba ofesi amaghị onye "Nkoli nwa Nsukka" bụ.
O bụ onye na-akpa ọchị ma na-eme ihe onyonyo, ya mere na mma ya nke na-egbuke egbuke na-agbaji ụmụnwoke olu.
10. Cynthia Nwadiora "Ceec"
Ị nụla ebe Igbo kwuru 'elewe ukwu egbuo ewu?', ọ dịka e bu Cynthia n'uche were kwuo ya bụ okwu.
Cynthia fọrọ ka o merie ihe emume 'Big Brother' e mere n'afọ 2018. Ma rue ugbua, aha ya dị n'ọnụ onye ọbụla maka mma ya nakwa omume ya.