You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dimkpa ndị na-atụ akpịrị
Ọ bụ eziokwu ama ama na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị Igbo na-agba mbọ pụrụiche n'ime agbụrụ niile dị na Naịjirịa.
Ọ bụkwa ihe ọzọ ama ama na ha na-ama mma pụrụiche. I jịkọzie ihe abụọ ndị a, gịnị ka ị ga-enweta?
Ngwa bịa hụrụ ụmụnwoke ndị Igbo mara mma, na-agba mbọ ụmụnwaanyị na-achọ ka akara ọkụ.
Ndị na-eti egwu
1. Patoranking
Patrick Nnaemeka Okorie ama dịka 'Patoranking' bụ onye otiegwu ama ama si Ebonyi steeti.
Ọ lụbeghị nwaanyị, ọ mụbeghikwanụ nwa ka ụfọdụ ndị ibe ya na-alụbeghị nwaanyị si mee.
O nwekwara ego ugbua n'agbanyeghị na ọ tara ezigbo ahụhụ ka ọ na-etolite. Ị hụla ụgbọala ya na etu o si eke ekike?
2. Jidenna
Jidenna Theodore Mobisson bụ onye otiegwu si Enugwu steeti. Nna ya lụrụ onyeọcha, a mụọ ya na mba Amerịka.
Ọ lụbeghị nwaanyị, mana ọ na-ewuru ọtụtụ ụmụnwaanyị, ọtụtụ bụ ndị ga-achọ ịmụrụ ya nwa n'efu (ị ghọtago?).
3. Lynxx
Chuka Edozien a ma dị ka 'Lynxx' bụ onye Delta steeti. Nna ya bụ John Edozien bụbu osote gọvanọ chịrị Bendel bụzi Delta na Edo steeti ugbua.
Lynxx na-akụbu egwu ụwa nke Bekee kpọrọ 'secular music', mana o kwuru na o chegharịala na-akụzi egwu na-abụghị maka ịchụ nwaanyị maọbụ imefu ego.
Ị hụla ya ebe ọ na-eyighị uwe elu? Ngwa mechie ọnụ gị ghe oghe.
4. Zoro
Chimaobi Chrismanther Owoh ji egwu 'Ogene' tibata n'ọgbọ egwu na Naịjirịa niile. A mụrụ ya n'Anambara steeti mana ọ bụ onye Enugwu steeti.
Ndị ọgba bọọlụ
5. Alex Iwobi
Alexander Chuka Iwobi bụ nwa nwanne ọgba bọọlụ bụ JayJay Okocha. O na-agbara Arsenal bọọlụ. O sokwa Naịjirịa si asọmpị Iko Mbaụwa nke 2018 laghachite.
Enweghị ihe ọzọ ụmụnwaanyị ga-achọ n'aka ya, ha ga-achọ ego ya na-anyitu akpa nakwa akwụkwọ ikike njem ya (o nwere nke Briten bụ ebe o toro).
6. Ịheanachọ
Kelechi Ịheanachọ so n'otu ndị Naịjirịa gara asọmpị Iko Mbaụwa 2018 na mba Rọshịa. Ọ na-agbara Leicester City ugbua.
Ị ma na ọ e tinyere akara aha ya n'uwe o ji agba bọọlụ na Leicester City?
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arọ nrọ ịbụ nwunye ya maka ụdịrị ego ọ na-akpata na bọọlụ.
7. Victor Anichebe
Victor Anichebe bụ onye Anambara steeti. Ọ gbaara Naịjirịa bọọlụ ihe ruru afọ anọ.
Ọ gbakwaara Everton nakwa Sunderland FC dị n'England tupu ọ gaa otu Beijin Enterprise dị na China bụ ebe ọ nọ ugbua.
Dịka egwu Morocco Maduka gụrụ sị na "ọgaranya amaka mma n'okorobia' ọ bụghịkwa naanị mma ka ọ mara, o nwekwara ego 'na-esi isi' (ọ bụrụ asị jụọ 'DJ Cuppy' ọ zụnyere ụgbọala G-Wagon oge ha na-ayị).
Ndị ome ihe onyonyo
8. Bryan Okwara
O meriri asọmpị ịchọpụta nwoke 'kacha mma na Naịjirịa' n'afọ 2007. Ugbua, ọ na-eme ihe onyonyo nakwa onye ngosi akwa bụ 'model' na Bekee.
Ị ma ụmụnwaanyị ole na-arọ nrọ ịbụ nwunye ya otu ụbọchị?
9. Chiwetel Ejiofor
Onye Enugwu steeti a mụrụ na mba ofesi, Chiwetel Ejiofor pụtara n'ihe onyonyo bụ 'Half of a Yellow Sun' nke e si n'akwụkwọ Chimamanda Ngozi Adichie dere rụpụta.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị na-arọ nrọ ụbọchị ọ ga-asị ha "sịịịịị, biko gee m ntị ka m gwa gị".
Ọ bụghị naanị mma ka ọ mara, o nwekwara akwụkwọ ikike njem nke mba Amerịka, ma nwekwaa ego igwe nke Bekee kpọrọ 'hard currency' (ị ghọtago?).
10. Chris Okagbue
Chris Okagbue bụ onye ogba-egwu bụrụkwa onye ome ihe onyonyo na Nollywood. O nwere ejima a kpọrọ Cris Okagbue. Nwanne ha nwaanyị bụ Sandra Okagbue, ugegbe oyibo Flavour.
Nna ha nwụrụ anwụ bụbu Obi Ọfala Okagbue, bụbu Obi nke Ọnịcha a ma dịka 'Agbọgidi'.
Chris bụ ọmụmaatụ 'a hụ dimkpa a hụ ogologo imi ya.'
Akụkọ ga-amasị gị