Herder Farmer Crisis: Ụjọ m bụ na esemokwu a nwereike ịghọrọ agha ọzọ - Wole Soyinka

Odeeakwụkwọ a ma ama bụ Wole Soyinka kwuru na ndị ọchịehi esunyela agha na Naịjirịa.

Ọ gwara BBC nke a na mkparịtaụka ha na ya nwere gbasara ọnọdụ esemokwu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo.

Soyinka kwuru na eziokwu bụ na ihe kara ndị ọchiehi obi ị kpa ụdịrị agwa ha na-akpa bụ na ha cheere na onye nke ha nọ n'ọchịchị

O kwuru na "anyị nwereike ịbanye oge esemokwu a ga-aghọrọ ịlụ ọgụ ma ghọrọ kwa... a chọghị m ịkpọ okwu ahụ aha - agha ịmeụlọ ọzọ nke ga-aka njọ..."

"Ọ bụ olileanya m na oge ga-eru mgbe a ga-anapụ ndị ọchịehi ngwa agha ọbụla ha ji ma laghachi n'oge ọ bubụ naanị osisi na igwe okwu ka ha na-eji bu"

Lee n'afọ 2019 mgbe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ si ha machịrị nchịgharị ehi

Ndị mmadụ nọ n'elu soshal midia asa gọvanọ Dave Umahi bụ onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ maka etu o si kwuo na o teelarịị ha machịrị ichị ehị gagharị na mpaghara ahụ.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ iwu Nnamdi Kanu nyere ha ọhụrụ a mere ha ji pụta kwuo nke a.

Cheta na Gọvanọ ndị na-achị steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ kpebiri na iwu ga-emegide ịchị ehi na-agagharị na mpaghara ahụ kamgbe afọ 2019.

Ha mere mkpebi a na nzukọ pụrụiche ha nwere n'Enugwu.

Ha machichara ndị ọchịehi ibu egbe AK47 ma o bụ mma agagharị.

Ndị Gọvanọ a kwuru na ndị nchekwa steeti ha niile ga-eso hibe iwu a.

Onye mgbasa ozi nke Gọvanọ Ebonyị steeti bụ Mazi Emmanuel Uzo gwara BBC na nke a bụ maka nchekwa obodo ndị dị n'Ọwụwa Anyanwu.

Ụzọ gwara BBC na ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ga-edegara Onyeisiala bụ Mohhammadụ Buhari akwụkwo, ka enwe nzụkọ ha na ọnyeisiala na ndị isi ngalaba nchekwa n'Naijirịa maka usoro a ga-eji weta udo n'Ọwụwa Anyanwụ.

O kwukwara na n'oge na adịghị anya, na ndị Gọvanọ steeti ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ ga ehibekwa ngalaba ndị na-echekwa ime ọhia a kpọrọ 'Forest Guard' dịka e si nwee n'Enugwu Steeti.

N'otu aka ahụ, ha hiwekwara atụmatụ a ga-eji ụgbọelu chụpụsịa ndị omekome nọ n'ọhịa n'Ọwụwa Anyanwụ ma hiwekwa otu ga na-ahụ maka nchekwa nke ndị Abel Obi Umahi bụbụ ọchịagha ga-anọ n'isi ya.

Otu ihe ọzọ ha kwukwara maka bụ ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam, bụ nke ha sị Minista na-ahụ maka ụgbọelu kwere nkwa na a ga-arụ n'ọnwa Decemba nke afọ a.

Ha sịkwa na a ga-ahazi ọdọ ụgbọelu Sam Mbakwe nke dị na Owerre ka ọ nabata ụgbọelu kwesiri ịga Enugwu ma hụ na nchekwa dịrị ndị na-eme njem.