You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ugwuanyi: Ndị ọchị ehị nabata ịzụ ehi n'ala akpapụtaara unu
Gọvanọ Ụgwuanyi kwuru nke a na nzụkọ ndị ''Watchman Catholic Charismatic Renewal Movement(WCCRM)'' mere n'Enugwu.
Ọ sị n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya ọnụ n'ihe gbasara ihe ụka bụ ụkọchukwu Chinedu Nwoye kwuo nke a.
Ụgwuanyi sị na ọ bụ ihe nwute na ana-kpọ ndị ọchị ehi ndị Fulani.
"Ọ bụ makana ọ bụghị onye Fulani ọbụla bụ ọchị ehị.Ụfọdụ n'ime ndị Fulani bụ ndị ụkọchụkwụ ma bụrụkwa ndị ezigbo mmadụ.Ọtụtụm mmadụ echezọna na ọnye bubụ onyeisiala Naijirịa akpọrọ Umaru Yar'Adua,onye Katsina steeti bụ onye Fulani ma bụrụkwa ezigbo mmadụ mepụtara ezigbo ihe mgbe ọ nọ n'ọchịchi.
Gọvanọ Ugwuanyi yọkwara ka ndị ụkọchukwu kpere ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ekpere.
"Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-agbara ndị n'ọchịchị ọsọ maka ụjọ na-aga ghọtaghie ha mana a nama gwa ha ka ha bido kpewere ndị n'ọkwa ọchịchị ekpere ka obodo Naịjirịa dimma.
"Ọ bụrụ na Chukwu buru ụzọ n'ihe niile Enugwu steeti na-eme ,ihe ndị ọzọ ga na-agaa siriri werere.