Ihe ga-akwụsị nsogbu dị n'ịchị ehi - Ipob

Onwere ihe enwere ike ime maka nsogbu na apụta na etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo nke butere ogbugbu mmadụ n'ala Igbo, nakwa Naịjirịa?

Na mgbe na etighị aka, Ohaneze ndị Igbo rịọrọ ndị ọrụ ugbo nwere ebe a na-azụ ehị tụpụ a lụọ agha Biafra ka ha laghachị na yabụ ọrụ makana udị ọrụ nwere nnukwu uru.

Mana, BBC Igbo na Otu n'ime ọnụ na kwuchitere Ipob (bụ otu chọrọ ka ikewapụta Biafra site na Naịjirịa) bụ Ụkọchukwu Peace kwuru okwu na ekwentị, o wee sị na ihe ga ebute mkpebi na nsogbu a bụ ka Biafra kwụrụ n'onwe ya.

Ụkọchukwu Peace gwara BBC Igbo na "ndị a na-achọ i ji ehi nwe nakorita ala ndị igbo ncha".

Peace kwukwara na ọdịghị n'aka gọọmentị ị nye ndị na-achị ehi ala makana onweghị ndị Igbo na-azụ ahịa na steeti dị icheiche enyere ala n'efu.

Mana otu onye ọnụ n'eru n'okwu bụ Emeka Eze kwuru na ọdịya ka ihe Ipob na-atuegwu bụ ihe a akpọrọ 'cattle colony' na asụsụ Bekee.

"Ndị a na-achị ehi kwesịrị ịzụ ala dika ndị Igbo sị azụ ala ha ji azụ ahịa, mọ bụ rụọ ụlọ obibi n'obodo di icheiche na Naịjirịa. Ọ bụ n'ime ala nke a ha zụrụ ka ha ga-achị ehi ha," Peace kwuru.

Mana Ụkọchukwu Peace kwetere na ihe Ohaneze kwuru banyere na uru dị na-ichi ehi, dịkwa na ịmalịte ebe a na-achị ehi.

"Ọtụtụ n'ime anyị alaghachiela na-ichi ehi. Ị ga n'Anambra steeti taa, ọtụtụ ebe a na-chị ehi a malịte go,"

Na ngwụcha, Peace nwere nchekwa na ndị Igbo malịte udiri ọrụ ịchị ehi, ọ ga-anapụ ọrụ n'aka ndị na-achị ehi n'ala Igbo ụgbụa.

Ndị na achị ehi na bụkarị ndị Fulani. Ha na agọ na ọbụghị ha na-egbu mmadụ, mọ na akpata nsogbu ndị na eme ka ogbaghara dị, ma na atụ aka na ọ ndị na o maka ichekwa ehi ha mere ha ji na-ejide egbe na mma.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: