You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dana ekwuola okwu maka ụgbọelu ha gbabara n'ime ọhịa
Ụgbọelu Dana si Abuja gbafele ụzọ ya were gbaba n'ọhịa n'ọdọ ụgbelụ di na Port Harcourt bụ isi obodo Rivers steeti.
Akpọpụtara ndị mmadụ nọ n'ime ya bụ ụgbọelu n'ime ọhịa ahụ, mana onweghị onye merụrụ ahụ.
Dana Air apụtala ugbua ikwu naọbụ oke mmiri ozuzo bụ ihe kwagharịrị ụgboelu ahụ n'ime ọhịa .
Ha kele kwara onye n'anya ụgbọelu ahụ maka amamihe ya na mbọ ọ gbara n'ịgbochi ihe mberede.
Mgberede ụgbọelu Dana
- N'afọ 2012, ụgbọelu Dana Air bu mmadụ 153 dara na Lagos gbuo mmadụ niile o bu
- N'afọ 2018 n'ọnwa Ferburuwarị, akụkọ pụtara maka otu ụgbọelu Dana Air ụzọ ya dapụru ka o ruru ala
- N'ọnwa Ferbụrụwarị ọzọ ka ụgbọelu Dana Air gbabara n'ime ọhịa ebe ọ na-efetu na PortHacourt
Onye ọnụ n'eru n'okwu gbasara ihe njem ụgbọelu a na-akpọ Chuks Iwelumo gwara BBC n'oge eruela mgbe ndị ịsị ga-ebili n'ụra.
Iwelumo mara atụ ihe mberede dị ịcheịche kwadoro ịme ụgbọelu kara ị bute ọnwụ ndị mmadụ.
Ọ sị na ndịịsị ekwesịghị iche ka ihe mberede na-ebute anya mmiri dịka nke Dana Air mere n'afọ 2012 mee kwa ọzọ tupu ha nara ihe ha ga-eme ya.
Anyị na-agbanị inweta ndị ụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ụgbọelu bu FAAN mana ọ nwebeghị uru.
Na mgbe eteghị aka, ụzọ ụgbọelu Dana si Legoos dara ka ọ na-agba n'okporo ya n'ụdọ ụgbọelu di n'Abuja.
Onyeisi ụlọ ọrụ na ahụ maka ihe banyere ugbọelu a na-akpọ Federal Airports Authority bụ Henrietta Yakubu kwetere na ihe mgberede a mere.
"Otu ụgbọelu Dana bu akara 9J0363, si Abuja na-aga ọdọ ụgbọelu Port Harcourt gbafele okporo okwesiri ị gba ka oruru Port Harcourt."
"Ọ dị ka ọ ga abụ nnukwu miri bu ikuku na Port Harcourt mere ka ihe mee."