Ụgbọelu DANA ọkaara igbu ndị mmadụ taa?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọbere ihe ka ndị mmadụ ji gbanarị ihe mberede ụgbọelu kara igbu ọtụtụ n'ime ha n'Abuja.

N'agbanyeghi na ndị otu ụgbọelu DANA gọrọla aka ha na onweghi ihe dị otu ahụ mere ha, ndị nọ n'ime ụgbọelu ahụ kwuputara ọnụ ha ma wepụtakwa foto gosiri na n'eziokwu ọnụụzọ ha fekapụrụ ka ha ka nọ n'ime yabụ ụgbọelu.

DANA wepụtara akwụkwọ ndepụta sị "Ọdịrị ihe a enweghị ike ime maọbụrụ na onyeije ejighi aka ya chọọ imepe ya.

"Etu esi rụọ ọnụụzọ ụgbọelu anyị, onweghị ike ijiri aka ya dapụ ma ọ bụrụ na mmadụ akpaghị ya aka.

"Ndị injinia na ụfọdụ ndị otu Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA) enyochaala ụgbọelu a akpọrọ aha ka o feturu n'Abuja, mana onweghi ihe ọjọọ ha hụrụ.

Onwekwaghị ihe ịtụ egwu mere n'oge ọbụla."

O mere ka o meghị?

Lee ihe nkiri na-egosi na ọnụụzọ ahụ fekapụrụ

Otu onye nọ n'ụgbọelu ahụ oge ihe a mere bụ Ola Brown, gara n'igwe okwu Twitter sị

Onye ọzọ kwuputakwara na ọ nọ n'ime ụgbọelu ahụ bụ Dapo Sanwo kwuru sị:

Ndị ọdụ ụgbọelu Legọsị tinyere ọnụ n'okwu ahụ sị

Ihe onye ọbụla na-ajụ ugbu a bụ kedụ nke bụ eziokwu? Ebe ndị DANA na-ekwu na omeghị mana ndị ọmetụtara na-ekwu na o mere eme.