You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụgbọelu danyere na Grand Canyon egbuola mmadụ atọ
Ụgbọelu bu ndị mmadụ na-aga nlegharịanya n'ebe a na-akpọ Grand Canyon na mba Amerịka dara wee gbuo mmadụ atọ n'ime ndị nọ n'ime ya.
Ndị nwe ụgbọelu a bụ Papillion Airways. Akpọrọ udịrị ụgbọelu a Eurocopter EC130.
Ndị na-ahụ maka Grand Canyon sị n'ụgbọelu a mebiri ọfụma mgbe ọ dara na nso ọdọ ụgbọelu.
Onyeisi ndị uweojii na Hualapai Nation bụ Chief Francis Bradley gwara ndị ntaakụkọ ABC na mmadụ isii na onye na-anya ya nọ n'ime ụgbọelu a.
Amabeghị ma onye nya ụgbọelu a o so na ndị nwụrụ anwụ.
N'elekere itoolu n'ụtụtụ n'Amerịka, mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ ka nọ n'ebe ụgbọelu a dara, maka ọ rara ahụ ịrute ebe ahụ.
Nnukwu ikuku na ọchịchịrị so mee ka ọ raa ahụ, maka na ọ bụ helicopter ka eji ebupu ndị a merụrụ ahụ.