Fulani herdsmen Crisis: Aka akparala onye Fulani ọchịehi bu akpa mgbọ egbe akpagharị

Otu onye Fulani ọchịehi ejejiela chi dịka a nwụchiri ya Tuzde e be obu akpa mgbọ egbe akpagharị.

Nke a mere n'obodo a kpọrọ, Obudi Agwa Autonomous Community nke dị n'okpuru ọchịchị Oguta n'Imo Steeti.

Akụkọ kọrọ na ha dị ndị ọchịehi abụọ na-akpagharị n'ogbe ahụ, otu n'ime ha bu egbe ọgbatụwatụwa.

Mana onye nke bu egbe gbalagara ọsọ.

Mgbe ha jụrụ onye nke ọzọ ihe dị n'akpa o bu, o kwuru na ọ bụ garrị.

Ma mgbe ha naara ya akpa ahụ n'ike, mepee ya, ha hụrụ na ọ bụ mgbọ egbe juru na ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Imo steeti bụ Ikeogu Orlando gwara BBC Igbo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.

O kwuru sị, "A natara onye ọchiehi ahụ mgbọ egbe agbabeghi agba ruru iri anọ na abụọ.

"Anyị anwụchiela ya ugbua, ọ nọ n'ogige anyi, mana anyị ka na-eleba okwu ahụ anya".

Okwu banyere ndị ọchịehi na-arị elu na Naijiria ugbua.

N'ọgbakọ ndị 'Northern Elders Forum' nwere ụbọchị Tuzde, ndị isi ndị Ugwu gwara umunne ha ka ha hapụ mpaghara ndịda ma lọtawa be ha.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gi: