Darron Gibson nwetere ezumike maka oke mmanya ọ ṅụrụ

Darron Gibson

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Darron Gibson bụ onye ala Ireland

Nwụchi ndị uweojịi nwụchịrị Darron Gibson ka ọ na-anya ụgbọala oge mmanya na-egbu ya emeela ka otu egwuregwu ọ na-agbara bọọlụ bu Sunderland sị ya ga ihe ndị Bekee na-akpọ suspension.

Aka na-achị Sunderland bụ Martin Bain kwuru na ha ebidoola nyocha okwu a makana ndị otu ha niile kwesiri ịkpaagwa ọfụma n'oge ọbụla.

Bain kwuru sị, "onye ọbụla nupuru isi n'iwu n'otu anyi ga-ata ezigbo ahụhụ."

Ndị uweojii Northumbria kwuru na ha jiri Gibson dị afọ 30 ugbua makana ọ ṅụrụ nnukwu mmanya.

Cheta na ke mgbe ọnwa nke mbụ na afọ a, Gibson agbaghị asọmpị ọbụla makana ọnwere mmehu ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: