Iko FA: Lukaku na Matic nyere United mmeri

Ebe foto si, Getty Images
Romelu Lukaku nyere goal nke 12 ya na asọmpị 11 nke ọ gbara na Iko FA ka Manchester United gbagburu Brighton jiri were ruo agba nke ọkara na ya bụ asọmụmpị.
Lukaku jiri isi kunye goolu nke mbụ ka Nemanja Matic gbapuru ya boolu na agba nke mbụ na asọmpị ahu.
Matic na onwe ya mechara nweta goolu nke ya mgbe ọ jikwara isi nata bọọlu Ashley Young gbaara were tinye ya n'ime goolu.
Mmeri a United wetara ga-enye ha ikike ijiri chụwa ịlaghachị Champions League nke afo na-abịa ka Sevilla gbapụrụ ha na nke afọ a.
Agbanyeghị na United eribeghị goolu na Iko FA nke afọ a, ukwu jiri ha ụnyahụ nke mere ka ha gba ka ndi si na ụra tete.
Na agba nke abụọ n'asọmpị ahụ Brighton nwetara ọtụtụ ohere inye goolu nke ha tupu goolu Matic mechie akwụkwọ.
Mourinho, bụ onyendu United sịrị na ya na "ata onyeobụla uta", sịkwa na ndị otu ya nọ na 'atụ egwu' ịgba bọolu etu okwesiri.
Ndị kwu United na azụ, bụ ndi ka na-ewe iwe maka mmeri Sevilla meriri ha, zịkọkwara iwe ha ka a nọ n'ime ya bụ egwuregwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











