Etu a sị ndị uweojii si gbagbuo otu nwoke n’Umuagwo, Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si akụkụ mahadum ‘Imo state University of Agriculture and Environmental sciences’ dị n’obodo Umuagwo, n’Imo steeti na-ekwu mgbọ ndị uweojii tugburu otu nwaamadị echebụ bụ nwata akwụkwọ ahụ n’ehihe taa bụ Tọọzde, ụbọchị 15 nke ọnwa Disemba, 2022.
Ndị nọ ebe ahụ ihe a emee gwara BBC Igbo na ụmụakwụkwọ mahadum a nakwa ndị ntorobịa obodo ahụ nọ na-eme ngagharịiwe megide ebubo mkpeahụ n’aka ndị uweojii ebe ahụ n’ehihe a mana ndị uweojii wụchiri ebe ahụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.
E kwuru na nwaamadị a a sị aha ya bụ Izuchukwu Okorie nọ na-agafe ebe ahụ dịka osoghi eme ya bụ ngagharịiwe dịka mgbọ tụrụ ya.
E kwuru na ebugara ya ụlọọgwụ St John's Hospital dị n’Obinze ebe a gbara ama na ọ nwụọla.
Nwanne nwoke nwaamadị a s gbara afọ 26 gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo okwu banyere ihe mere.
O kwuru “Nwanne m abụghị nwata akwụkwọ na mahadum a, o soghị eme ya bụ ngagharịiwe”
“Ọ bụ ụmụakwụkwọ nakwa ụfọdụ ndị uweojii ebe ahụ bugara ya ụlọọgwụ ebe e kwuru na ọ nwụla”
‘E bugala ya ụlọ ebe a na-edobe ozu ugbua dịka e nyere ngwo ngwo ya niile nke gụnyere ATM Kaadị ya, Igodo ụlọ ya, nakwa ego N300 a hụrụ n’akpa ya’
‘Nwanne m bịara leta m, ọ lụbeghị nwunye.’
‘Nna ya ka nwụrụ n’afọ atọ gara aga nne anyị bụ ajadụ.’
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam gwara BBC Igbo
‘Anụbeghị akụkọ a mbụ, kpọghachie m n’oge ọzọ’
Mana mbọ niile BBC Igbo gbara inata ozoi banyere ebubo mbọ itugbu nwata akwụkwọ amịtaghị mkpụrụ dịka ọ zabeghị ozi anyị ruo ugbua.

Ebe foto si, Reuters
Cheta na n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na ndị ntorobịa mere ọtụtụ ngagharịiwe nke ha kpọrọ ‘EndSars’ n’ọnwa Ọktoba nke afọ 2020 megide ndị uweojii Naịjirịa ma mee ọtụtụ mkpesa banyere mmekpa ahụ n’aka ndị uweoji Naịjirịa.
Mkpesa ndị a malitere site n'ịkpọ oku ka achụsasị ngalaba ndị uweojii a kpọrọ, Special Anti-Robbery Squad (Sars).
Onyeisiala Muhammadu Buhari mechara machie ngalaba ahụ, bụ nke ọtụtụ eboro ebubo mkpekpa ahụ, mwakpo nakwa ihe ndị ọzọ n’ụbọchị 11 nke ọnwa Ọktoba, 2020.
Mana agbanyeghị na a machiri ngalaba ahụ, akụkọ mmekpa ahụ n’aka ndị uweojii Naịjirịa ka bụkwa ihe a na-anụkarị n’akụkụ dị iche iche na Naịjirịa ruo ugbua.








