Obi Onitsha agaghị izute Atiku n'obi gọọmentị, ọ bụ nghọtaghie - Ọnụ na-ekwuru Obi Onitsha

Obi na-achị Ọnịcha, Atiku Abubakar nakwa ndị Eze ndị ọzọ.

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Facebook

Njem achụmnta vootu nakwa ileta Gọvanọ Anambra steeti nke Atiku Abubakara gara n'Anambra steeti n'ụbọchị Tọzde akpalitela okwu n'ọnụ ọtụtụ mmadụ.

Mgbe Atiku bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 gara Anambra, o kwuru na ọ bụ ya bụ ụzọ ndị Igbo ga-esi nweta ọkwa ọchịchị.

Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ malite ịkatọ ya maka okwu a na soshal midia na-ekwu na okwu ya adabaghị n'ihi na e nwere onye Igbo so azọ otu ọkwa ahụ.

Okwu ọzọ mapụtara na njem Atiku Abubakar n'Anambra bụ gbasara ma Obi Onitsha bụ Igwe Nnaemeka Alfred Ugochukwu Achebe a gara zute Atiku Abubakar n'obi gọọmentị.

Ụfọdụ ndị mmadụ katọkwara Igwe Achebe maka nke a na-ekwusi ike na o metaghị ya dịka ọ bụ Atiku n'onwe ya kwesiri ịbịa zute ya n'Obieze ya iji kwanyere ya ugwu dịka o si mee ndị Igwe ndị ọzọ n'akụkụ Naịjirịa ndị ọ garala.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Mana ọnụ na-ekwuchitere Obi nke Ọnicha bụ Nnaemeka Maduegbuna gwara BBC Igbo na ọ bụ nghọtaghịe si n'aka ndị mmadụ.

O kwuru "Obi na-achị Ọnịcha gara nzụkọ ndị Igwe Anambra bụ 'Anambra state Traditional Council', ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ zute Atiku".

Ọ gara n'ihu kọwaa na Atiku n'onwe ya abịaghị ịhụ Obi na-achị Onitsha n'ihi na ọ kaara ịbịa n'Obieze ya maọbụrụ ya ka ọ bịara ikele.

"Ndị otu PDP ekwubuola na Atiku na-abịa Anambra steeti izute Gọvanọ Chukwuma Soludo, ndị Igwe Anambra steeti nakwa ndị nkwado ya nọ na steeti ahụ, ọ bịaghị ikele Obi nke Onitsha n'onwe ya".

Ọ gara n'ihu kwuo na Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'aha otu Labour Party zutekwara ndị Igwe ndị ahụ n'otu ụzọ a mgbe ọ bịara njem n'Anambra steeti ọnwa ole na ole gara aga.