Stress: 'Enweghị ezumike zuru oke nwereike ibute mgbakasị ahụ na ọnwụ'

Echum ụra

Ụfọdụ ọrụ anaghị enye ohere ezumike nke bụ na ndị na-arụ ya bụ ọrụ anaghị enwekarị ohere inweta onwe ha, afọ kwuru afọ.

Ọrụ ndị a gụnyere ọrụ ndị uweojii, ndị agha, ndị ọrụ ụgbọelụ na-eme njem, ọrụ ntaakụkọ, ndị ọrụ ahụike, ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ ụgbọala, ndị na-ere nri, ndị ọgbatumtum na-eme njem na ọrụ ndị ọzọ.

E nweghi ezumike zuru oke n'ọrụ na-ebute ọtụtụ ihe dị iche iche n'ahụ mmadụ.

Ọ bụghịkwa naanị ọrụ na-ebute mgbakasị ahụ bụ nke Bekee na-akpọ 'stress', mkpa ezinaụlọ, etu i si eri nri nakwa ọnọdụ ahụike gị nwekara ike itinye aka ụfọdụ oge.

onye na-arahụ ụra

Ebe foto si, Getty Images

Ihe enweghi ezumike na-ebute

Ọ na-ebutenwu ọbara mgbalielu, ọ na-emekwa ka shuga dị n'ọbara mmadụ rịa elu, ọ na-emekwa obi ịkụ kpum kpum.

Ọ nwekwara ike ime ka mmadụ na-eri oke nri ọkachasị nke bu oke shuga, na-ese anwụrụ nakwa na-aṅụ oke mmanya, nke nwereike ime ka mmadụ buo oke ibu.

Mgbe ụfọdụ ọ na-ebutekwa mgbakasị ahụ; ịma atụ, onye nkuzi na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ị na-enwe ahụmgbakasị ebe ụmụakwụkwọ ya nọ.

Dọkịnta na-awa ahụ na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ichefu ngwaọrụ dị iche iche n'ime ahụ onye ọ wara ahụ, ebe nke na-adụ ntụtụ nwereike ịdụhie ya n'ihi ọma jijiji.

onye na-arahụ ụra

Ebe foto si, Getty Images

Ịma atụ ọzọ bụ na n'ihe dị ka oge a na-agba Ekeresimesi maọbụ na-eme ụfọdụ emume ndị ọzọ, ndị ọkwọụgbọala anaghị enwekarị ohere izu ike n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-akacha akpata ego.

Ụfọdụ n'ime ha na-agba ugboro ugboro ka ha nwee ike ịkpata nnukwu ego.

Ụdịrị agwa ahụ na-ebutere ọtụtụ mbere okporoụzọ n'oge ahụ, n'ihi na ụfọdụ na-arahụ ụra ka ha na-akwọ ụgbọala.

Ihe ndị ọrụ ahụike na-ekwu maka ezumike

Nwaanyị riri amusu n'ihe gbasara ahụike ụbụrụisi bụ Pamela Udọka kwuru na enweghi ezumike zuru ezu nwereike ibute agwa ọjọọ dị iche iche.

Ọ sị na ọ na-ebute ahụ mgbakasị n'ezinaụlọ, ụlọọrụ nakwa n'ọha.

Udọka sị na "ọ bụ ya mere e ji enye ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ oyibo ezumike ma a gụrụ gụrụ".

Ọ sị na enweghi ezumike zuru oke nwekwara ike ibute ọrịa ụbụrụisi dị iche iche.

O kwukwara na mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike ịmerụ onwe ya ahụ maọbụ merụọ ndị ọzọ ahụ maka ọrịa ụbụrụisi so na ihe enweghi ezumike na-ebute.

Udọka dụrụ ọdụ ka onye ọbụla gbaa mbọ wepụta oge maka ezumike n'ọrụ.

O kwukwara na ịrahụ ụra zuru oke bụ ihe kacha mkpa n'ezumike.

Ndị ọkammụta kwuru na ịrahụ ụra ihe ruru awa asaa n'ụbọchị dị oke mkpa.

Onye na-apị ekwentị
Nkọwa foto, Ndị dọkịnta na-ekwu na ọ dị mkpa iwetu ekwentị kwa mgbe kwa mgbe

Ha kwukwara na onye ọbụla chọrọ ezumike kwesịrị inwe oge ha ga-eji wetuo ekwentị ya n'akụkụ, ọkachasị mgbe ọ chọrọ ịrahụ ụra.

Onye ahụ kwesịrị ịkpọ ya mkpa ịhụ na o wepụtara oge ọ ga-eji na-alaba ụra kwa ụbọchị; ọ bụ n'ụtụtụ o, maọbụ n'abalị.

O kwukwara na ụlọọrụ ọbụla na-anaghị enye ndị ọrụ ha oge ezumike bụ nke Bekee kpọrọ 'leave', na-agba onwe ha egbe n'ụkwụ.