Etu otu nwaanyị si gbuo nwa ya ma taa anụ ya

Ebe foto si, Citizen Kenya
Aka ndị uweojii akparala otu nwagbọghọ mụrụ a na-ebu ebubo na o gburu nwa ya dị afọ abụọ ma taa ụfọdụ akụkụ ahụ ya na Kitengela dị na Kenya.
A gbara Olivia Kaserran n’anwụ na Tuzde maka ogbugbu nwa ya n’ụbọchị Sọnde mana ọ rịọghị arịrịọ ọbụla dịka ndị uweojii gwara ulọikpe ka ha jichie ya ruo abalị 13 mgbe ha ga-emecha nyocha. Mana ụlọikpe nyere ha ụbọchị iri.
A kpọọrọ nwada a dị afọ 24 gawa n’ụlọọgwụ dịka mwakpo a na-atụ egwu mechara nke ndị agbataobi sere n’ihe onyonyo.
N’ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya na Mọnde, Keserran sị na ọ wakporo nwa ya maka na ọ kpọrọ onwe ya asị ma sị na ọ taala nnukwu ahụhụ. O kwughi ụdịrị ahụhụ ọ tara.
Nwata a ka nọ n’ụlọakwụkwọ mahadum sị na ọ chọburu igbu onwe tupu ọ gbanwee obi ya ma malite ịsụ nwa ya mma ọtụtụ ugboro.
“Akpọrọ m onwe m asị. Ihere onwe m na-eme m, ọ bụ ya mere m jiri gbuo nwa m. Mụ na nwa ataala ahụhụ ebe ọ dị ukwuu,
Kedụ ka o si mee?
Na Sọnde ahụ, ndị agbataobi hụrụ ka nwaanyị a sụrụ nwa ya nwaanyị mma ma bepu ahụ ya.
Ndị agbataobi ji ọsọ gaa n’ụlọ ha chere na ndị ohi wakporo ha mgbe ha nụrụ mkpu mana ha hụziri ka nwaanyị a gba ọtọ ma jiri mma na-asụ nwa ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nke na-agbagwoju anya bụ na ọ na-asụ nwa ya mma ma na-ekwe ukwe abụ n’elu ya. Ndị agbataobi si na mpio na-ele ya maka na ọ gbachiri ụzọ ya.
Mgbe ha gbakara ụzọ banye, ya bụrụ na nwata ahụ anwụọla, ebe nne ya anaghịzi enwete onwe ya.
A kwasasịrị ụlọ ha niile, ma oche ha nakwa ihe onyonyo na ihe ndị ọzọ ji ọkụ latrik arụ ọrụ emebichala.
Otu onye agbataobi kwuru na ọ hụrụ ka nwaanyị a tara imeju nwa ya ahụ ebe nwa ya na-eti mkpu na-akpọ aha nne ya.
Onyeisi nyocha na mpaghara Kitengela bụ Benson Mutia sị na ha ga-agba Kaserran akwụkwọ ma ha mechaa nyocha.
“Ihe a bụ ihe mgbagwoju anya, anyị ga-ajụ ya ajụjụ iji mara ihe o jiri kpaa ụdịrị agwaa. Anyị ga-achọpụta ma ọ maara ụma gbuo nwa ya.”
Nke a na-abịa dịka akụkọ etu ọtụtụ ndị ụka siri buo ọnụ ma nwụọ na nrubeisi ụkọchukwu ha gwara ha buo ọnụ ka ha nwee ike zute Jizọs Kraịst.
Ụkọchukwu Paul Mackenzie nke ụlọụka Good News International n’aka ndị uweojii ugbua gwara ndị na-eso ya ka ha nwụọ n’agụrụ n’ihi ibu ọnụ.
Ndị uweojii Kenya sị ha ahụla ozu karịrị iri asatọ (80), na ha ka na-abọpụta ọtụtụ ozu ndị e liri n’ili na-emighi emi.
Ndị ntaakụkọ KBC kọwara ụkọchukwu Paul dịka onyendu ‘ndị otu nzuzo’ ebe onyeisiala Kenya bụ William Ruto sị na ọ bụ ‘onye oyi ndụ egwu’.









