Sri Lanka: akwụọla m n'ahịrị abalị 10 tupu m gbata mmanụ ụgbọala

Na mba Sri Lanka, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ahịrịa ụgbọala ebe a na-egote mmanụ ụgbọala kemgbe akụnaụba ha kpugbachara afọ n'ala.
Ahịrị ụgbọala dị n'isi obodo ha bụ Colombo ruchara kilometa ise (5).
Nwaamadị ala ahụ bụ Pratheem (43) sị na ya akwụọla abali iri na ya bụ ahịrị ebe ọ na-eche ka igo mmanụ ụgbụọla ruo ya.
Ọ gwara BBC na, "a na m arahụ na ahịrị a kemgbe Tọzde gara aga", dịka ọ ụgbọala ya na-arị ka esu na-aba ebe ọ ga-egote ụgbọala." Ọ bụghịkwa na a ga-agbajuru m ụgbọala m"
Ọrụ Pratheem bụ ibugharị ndị ọbịa n'obodo.
Oge mbụ ọ na-ebu ha aga ebe dị anya mana ugbua, ọ bụ naanị site na ọdọugbọelụ obodo ha ka o na-esi aga n'isi obodo ha.
Ọ bụ naanị njem atọ ka mmanụ ọ chọrọ ịgbata ga-emere ya tupu ọ bịakwa ọzọ.
Nwa ya maọbụ nwanne ya nwoke nwereike ị bịa gbanwee ya ịnye ya ohere ka o zuo obere ike, mana ndị ọzọ enweghị onye ga-agbanwe ha maọlị.
Nwoke ọzọ bụ Guna sị na, "a na m asa ahụ otu ugboro n'abalị atọ. Ị nyụ amịrị na-eri m rupee 20 (5p), ebe ịga mposị na-efu m Rupee 80 (19p),
Ihe kpọrọ nkụ

nke bụ eziokwu bụ na ọ dịghị nfe na Sri Lanka ugbua ebe onụahịa nri gbagochara pasent iri ise (50%).
Kemgbe ụkọ mmanụ a malitere ka ndị mmadụ ji iwe mee ngagharịiwe nke ha jiri chụpụ ma chụdakwa onyeisla ha bụ Gotabaya Rajapaksa.
A na-eche na ọ bụ mmekpeahụ ya na ọrịa Coronavirus soro bịa tinyere ha na ọgbaghara ahụ ya na iwu ọhụrụ ndị gọọmenti tinyere mere ya, dịka ịweda ụtuisi nakwa ịmachị fetịlịza ọkụ ọkụ.
Ego-igwe Sri Lanka fọrọ ntakịrị ka ọ gwụ bụ ihe ha nwere iji gote ihe dịka ọgwụ, mmanụ ụgbụọala na fetilaịza.
Guna sị na ya mechere soro ndị ngagharịiwe gara kusuo onyeisiala mgbe ha gara n'obi ya.









