Cost of living: Ụzọ ise ụmụafọ Naịjirịa si na-anya ndụ n’ihi ọnụ ngwaahịa na-arị elu

Many Nigerians are facing an economic squeeze, with inflation reaching record highs.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa nọ n'oke ụkọ ka ọnụ ngwaahịa riri elu karịa etu ọbụla ọ rịla mbụ
    • Onye dere ya, Yusuf Akinpelu
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ BBC News
    • Ebeg o si, Lagos

Dịka ọnụ ngwaahịa bịara rịa elu n’ime ọnwa Jenụwarị karịa ka e nwere ike i si hụta ya n’ime afọ iri atọ, ihe ruru ọkara ọnụọgụ ụmụafọ bụzi ndị na-ebi ndụ n’ime ụbịam ọnụntụ dịka ihe mkpata ha n’ụbọchị na-adịghị eru $1. Ha enwekwaghị ike ịzụtanwu ihe ndị ha chọsiri ike.

Mkpebi gọọmenti nwere ịkwụsị ego e ji ebelata ọnụahịa mmanụ tinyere mbudata ọdịda ego Naịra emeela ka ọnụ ngwaahịa dị icheiche gbagoo elu.

Nke a na-emetụta akpaego ụmụafọ Naịjirịa n’ebe ọ dị njọ ma na-akwalitekwa iwe na ọnụma tinyere ịwakpo ụlọ nchekwa ihe oriri na ụgbọala trọk ndị bu ihe oriri ya na njem mkpesa n’ogbe dị icheiche.

Ụlọọbaego ukwu Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria (CBN) nọọrọ na nso nso bulie ego ọmụrụ nwa ruo 22.75% na mbọ ọ na-agba ịkwụsị ọnụ ngwaahịa na-arị elu. Mana dịka ogogo ego ọmụrụnwa dị ala karịa ogogo ọnụ ngwa ahịa, ihe nke a pụtara bụ na ikikere ego ọ bụla echekwara na Naịra ga-ebelata na ngwụcha otu afọ.

Ya mere, kedụ etu ụmụafọ Naịjirịa si na-anya ndụ n’oge ihe isiike a? Ngwa lee ụfọdụ ụkpụrụ ndị ha wepụtara – site n’ịzụ ihe ndị na-agaghị efu ha oke ego ruo n’ịtụkọta ego n’ọha obodo maka nchekwa.

Zụọ ugbua, kwụọ ụgwọ na nkeji na nkeji

Ọnụahịa nri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnụego ihe oriri arịela elu karịçha

Dịka ọnụ ngwaahịa na-arị elu, ọnụahịa ihe oriri nwere ike gbakwunye ụma abụọ maọbụ ụma atọ n’ime ụbọchị maọbụ izuụka ndị na-abịa n’ihu. N’oge a na-atụle ịzụ ngwaahịa ndị bara oke uru maọbụ ngwaahịa ndị eji eme ihe kwa ụbọchị, ndị na-azụ ahịa na-enwe obi abụọ: zụrụ ugbua ka ọ bụ kwụkwasa ụgwọ ma emesịa.

Ikikere azụmaahịa na-anyụ ka ọkụ pụtara na ọ bụghị onye ọ bụla nwere ego o chekwara echekwa nke ọ ga-eji gboo mkpa.

Iji zute ọnọdụ a, Abike Jaji, onye na-ere ahịa akwa na Legọs Steeti họọrọ atụmatụ ‘zụrụ ugbua, kwụọ ụgwọ ma emesịa’ bụ nke onye na-atụ mgbere ihe ndị eji ahazi useekwu n’oge ya wepụtara.

Nwaanyị ahụ gbara afọ 60 kwuru na ewezuga usoro ịkwụ ụgwọ na nkeji na nkeji nke na-enweghị ọmụrụnwa, ọnụahịa ite na ngwa ndị ọzọ o ji eme ihe n’useekwu gaara agbagoola.

“N’ime ọnwa Disemba ka m zụrụ ite ndị ahụ mana ọ bụ n’ime ọnwa Febụwarị ka m kwụchapụrụ ụgwọ ya,” nke ahụ ka o kwuru.

“Onye na-ere ya na-anazi N250,000 ($155; £122) maka otu ngwaahịa ahụ bụ nke m zụtara n’ọnụego N165,000 ($102; £82) n’ihe karịrị ọnwa atọ gara aga. E wezuga usoro ịkwụ ụgwọ na nkeji na nkeji, a gaara m akwụ karịa etu a.”

Zụọ n’ụbara

Arịnze ndị na-enwe ihe fọdụrụ n’ụgwọ ọnwa ha na ngwụcha ọnwa ọ bụla, ichekwa ya n’akwụkwọ ego Naịra bụ nke na-abaghị uru. Ọnụ ngwaahịa na-arị elu na-ebudata ikikere akwụkwọ ego Naịra n’ike n’ike, ya mere ọ dị oke mkpa ịzụrụ ụfọdụ ihe n’ụbara.

Wakeelah Lawal-Tijani, onye na-eme nchọnchọ n’okwu ahụike n’ụlọọrụ gọọmenti etiti na-azụ ngwaahịa n’ụbara.

“Ọ bụrụ na e nwere ihe ọ bụla m chọrọ, a ga m a zụrụ ya. A chọghị m ịma ego ole ọ na-ada n’ihi na ọnụ ngwaahịa na-arị elu na nkeji ọ bụla,” ya ka o kwuru.

Ọ na-esi ma chekwaa nri ndị pụrụ imebi emebi n’ime igwe njụoyi ya ma chekwaa ndị nke pụrụ ịnọ ogologo oge n’ebe dị jụụ ma dịkwa kọrọkọrọ n’ime ụlọ ya tutu ruo mgbe ọ chọrọ iji ha mee ihe.

“Iji maa atụ, maka anụ maọbụ anụ akụkọ, a na m esi , mịkpọọ ya n’ikuku, tinye ya n’ime akpa plastik ma chekwaa ya n’ime igwe njụoyi. Ịmịkpọ ya n’ikuku na-enyere m aka ịchekwa mmanụ.

The Nigerian government's removal of fuel subsidies has worsened economic hardships for many citizens.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mwepu ego a na-akwụ e ji ebelata ọnụego mmanụ ụgbọala emeela ka ihe kawanye njọ

Chegharịa uche maka etu ị pụrụ isi belata mmefu ego

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana ọ bụghị onye ọ bụla pụrụ ịzụ ihe n’ụbara. Kama ya, ha chọpụtara ụzọ i si belata ego a na-emefu ma chefuo ihe ọ bụla dịka ihe mmefu.

Mmadụ atọ gwara BBC News na ha na-azụzi ngwaahịa ndị dị ọnụ ala; kwụsị iri nri n’ama ma kwụsịkwa imenyere ọhanaeze n’ogbe mmegharịahụ dị iche iche nakwa ebe ndị a na-agba oringo. Ha na-abanyezi n’otu ụgbọala ma kwọta onwe ha karịa ịkpọ ndị kabukabu ka ha bịa buru ha, mgbe ụfọdụ kwa ha e jiri ụkwụ gaa ebe ha na-aga karịa ịbanye n’ụgbo na-ebu ndị njem.

Otu onye gwara BBC News okwu sịrị na ya na-agazi mmemme ndị dịka agbamaakwụkwọ, ncheta ọmụmụ na mmemme ndị ọzọ naanị iji rie nri efu. Onye nke ọzọ kwuru na ya na-agbahapụ iri nri oge ụfọdụ.

Ibrahim Babangida, onye na-eme nchọnchọ na Katsina kwuru sị “a kwụsịrị m iji ụgbọala m eme njem tutu ruo mgbe m hụrụ na ọ dịla oke mkpa 100%.”

Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m kwụsịrị ịtụnyere ndị na-ere nri nakwa ndị na-ere ihe mmịcha ‘ice cream’ kwa mgbe kwa mgbe kemgbe ihe karịrị ọnwa abụọ. Na nke mbụ ya kemgbe Disemba 2019, akwụnyebeghị m ego maka DStv m.”

Sonyere otu ‘cooperative’ nakwa usoro ntụkọta ego maka nchekiwa

Maka ụfọdụ mmadụ ndị maara na ha ga-achọkwụ ego maka ihe ndị a tụwara anya ya n’ọdịnịihu dịka agbamaakwụkwọ, ụgwọ akwụkwọ maọbụ ụgwọ ụlọọgwụ, ha na-ehiwe otu ‘cooperative’ maọbụ otu ntụkọta ego maka nchekwa.

Ndị otu ‘cooperatives’ na-egosi ịdị uchu ha site n’ịtụkọta ego kwa mgbe kwa mgbe n’ime oge e nyere. Mgbe oge ahụ gasịrị, ha nweziri ike rịọ ka enye ha ego mgbazinye nke na-agaghị enwe ọmụrụnwa bụ nke ha ga-akwụghachi n’ịme ọnwa ole ha ga-ekwekọrịta.

Ndị na-agbaziri ego na-akwụ ụfọdụ ụgwọ dị aṅaa bụ nke a na-eji elekọta otu ahụ anya, mana ego ahụ na-adị ọnụ ala ọ bụrụ ma eji ya tụnyere ego mgbazinye ụlọakụ.

Etu a ka Halima Ibrahim na di ya si akwado azụmaahịa ngwa ndị eji ewu ụlọ ha ma zigakwaa ụmụaka ha ndị nwaanyị abụọ ụlọakwụkwọ.

“Nke ahụ bụ mbụ anyị ịgbaziri ụdị ego ahụ. A gbara m di mụ ume ka anyị were ya dịkwa ka o nyeere anyị aka igbo ọtụtụ mkpa ego ma zụbata kwa ụfọdụ ngwongwo,” ya ka o kwuru.

“Anyị gbaziiri nde Naịra abụọ ($1,269; £979) bụ nke anyị ga-akwụghachi n’ime ọnwa 10,” ya ka ọ gbakwunyere.

Ọzọkwa, ndị hiwere otu ntụkọta ego (nke a maara nke ọma dịka àjọ maọbụ esusu) na-abịakọta ọnụ ịtụ ọnụego ha kwekọrịtara kwa ọnwa. Otu onye n’ime otu ahụ na-eburu ego niile a tụkọtara na ngwụcha ọnwa ọ bụla, a na-esikwa etu ahụ bụgharịa ya n’etiti mmadụ niile dị n’ime otu ahụ.

A na-ahụkarị ụdị nke a n’etiti ndị na-arụ n’ụlọọrụ, ndị na-atụ mgbere ahịa maọbụ ndị si n’otu obodo, dịka ọ na-enyere ha aka ịchịkọta onwe ha nke ọma n’ụzọ mmefu ego, ịkwụ ụgwọ nakwa igbo mkpa dị ukwuu n’otu mgbe.

Ọnụego

Ebe foto si, Getty Images

Ịlaghachi na ngwaahịa ndị e mepụtara n’ụlọ

N’ime ọnwa Febụwarị, ọnụahịa mmanụ gaasị gbagoro site na N800 ruo N1,300 na mmalite afọ a. Ọnụ ngwaahịa ahụ afọla obere ihe ka o ruo ọkara abụọ kemgbe ọnwa iri na abụọ gara aga.

Ụfọdụ mmadụ alaghachila n’iji nkụ maọbụ unyu esi nri.

N’ọzọ yiri nke a, ndị mmadụ na-agba mbọ ibelata ego a na-emefu maka mmiri. N’otu obodo e nwere n’Ogun Steeti nke dị na mpụga Legọs, ndị ahịa na-ewere mmiri gbajuo n’oloolo plastik dịka ọnụahịa mmiri ndị a gbara n’oloolo riri elu n’ime otu afọ.

Abịa n’ụfọdụ akụkụ mpaghara ndịda ala anyị na Binin, akwụkwọ akụkọ Vanguard wepụtara ozi na ụfọdụ ndị na-ere ahịa alaghachila na mmiri ọṅụṅụ ndị a gbara n’akpa a maara dịka ‘iced water’. Nke a bụ mmiri jụrụ ezigbo oyi agbapụtara ma kechie n’akpa ‘nylon’ bụ nke nọọrọ n’ewu ewu na mmalite afọ ndị 2000 - ọ dị ọnụ ala karịa mmiri ndị a gbara n’oloolo n’ihi na ọ dịghị ọcha.