Nwajiụba na ndị ọzọ akpụpụla Bola Tinubu, APC na ndị ọzọ ụlọikpe maka ebubo ịzụ vootu

Ebe foto si, Chukwuemeka Nwajiuba/Facebook
Onye bụbu Osote Minista agụmakwụkwọ na Naịjirịa bụ Chukwuemeka Nwajiuba ekwuola ihe mere ha ji kpụpụ All Progressive Congress (APC), Bola Tinubu na ndị ọzọ ụlọikpe.
Nwajiuba gwara BBC Igbo na "ọ bụ eziokwu na a kpụpụrụ ndị pati m n'ụlọikpe n'ọnwa Juun, mana ọ bụghị m kpụpụrụ ha kama e denyere m aha m na ndị so kpupu ha n'ụlọikpe.
Mgbe BBC Jụrụ ya ihe ndị mere o jiri tinye aha ya na ya bụ akwụkwọ, ọ sị na "agbaghị m enwe ike ịsa ajụjụ a ugbua maka na ya bụ okwu nọzị n'ụlọikpe".
Cheta na otu Incorporated Trustees of Rights for All International kpụpụrụ APC, Bola Tinubu, PDP na Atiku Abubakar nakwa ụlọọrụ Independence Electorial Commission (Inec) maka na ha sị na ha gobiri ndị tụụrụ ha vootu na ntụliaka imeụlọ ha mere n'ọnwa gara aga.
Nwajibu so na ndị gbatara akwụkwọ ịzọ ọkwa onyeisiala na APC n'ọnụ ego otu nde narị naịra (N100m) nwetere naanị otu vootu e boro ebubo na ụfọdụ ndị ọzọ na-azọ ọkwa ji ego igwe dọla gobiri ndị bịara ịtụ vootu.
Ndị gbara ya bụ akwụkwọ akara ya bụ FHC/ABJ/CS/942/22 gosikwara ihe onyonyo ebe Rotimi Amaechi bụ onye so na-azọ ọkwa a na-akwa arịrị na ndị bịara ya bụ ntuliaka ji ego gobie ndị bịara itu ya bụ vootu.





