Lee onyeisi ojii mbụ n'Afrịka mabutere ọlaedo n'egwuregwu Olympic

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Marta Pausilli & Priya Sippy
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Afọ 1960 ka nwa Afrịka sị mba Ethiopia bụ Abebe Bikila meriri n'asọmpi ịgba ọsọ n’egwuregwu olimpik.
Nke a bụ nke mbụ onyeisi ojii si n'Afrịka na-enweta ọlaedo n'egwuregwu Olimpik.
N'isi ngwụcha asọmpi ịgbaọsọ ahụ, ndịagha Itali jị ọkụ-tọọchị na-achara Abebe Bikila ọkụ.
N'oge ahụ, Bikila gafere onye Morocco bụ Rhadi Ben Abdesselam nke a na-atụanya nwereike imeri n'asọmpi ahụ.
Ọ bụghị naanị na Bikila meriri n'asọmpi ịgba ọsọ ahụ, mana ọ bụ onyeisi ojii nke mbụ si Afrịka nakwa onye mbụ sị n'Ethiopia nwetere ọlaedo n’Olimpik.
O jị nkeji iri na ise manyere tịnkọm tịnkọm iri na isii wee merie asọmpi ịgba asọ ahụ nke bụ ndeko ọhụrụ.
Mana ọ gbagwojuru ndị mmadụ anya etu Bikila sị gbaa ọsọ ahụ na-enyighi akpụkpụụkwụ.
Tim Judah dere akwụkwọ maka Bikila kwuru na “onye mmeri n’asọmpi nwereike ọ ghara ịbụ onye ama ama mana oge o meriri, ndị mmadụ ga-amara ya; ọ ma bụrụ onye na-ewu ewu”.
Ka Bikila lọghachịtara na be nna ya, igwe mmadụ bịara nabata ya.
Mmeri ahụ Bikila meriri n'Olimpik bara uru ma metụta ọtụtụ ihe n’Afrịka.

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọzọ na-agba ọsọ bụ Haile Gebrselassie kwuru na “i lee anya ihe mere Afrịka, ọ bụ ka Abebe Bikila merichara n'ọsọ Olimpik ahụ a gbara na Rome ka mba dị iche iche n’Afrịka bidoro na-enwere onwe ha”.
Ụlọ mgbasaozi dị na Kenya kwuru na oge Bikila lọghachịtara na be nna ya, Empero Haile Selassie chiri ya echichi a kpọrọ kpakpando mba Ethiopia. O buliri ya n’ọkwa, nye ya ụlọ na ụgbọala Volkswagen Beetle ọhụrụ.
Etu Bikila sị malite ịgba ọsọ
A mụrụ Bikila n'afọ 1932 na Jato n’ime Ethiopia. Nna ya na-azụ anụmanụ.
Oge Bikila kwagara n’isi obodo mba Ethiopia ka o sonye na ndị ọrụ nchekwa na-eso Emperor Haile Selassie.
Ọ bụ oge ahụ ka Onni Niskanen bụ onye Sweden e nyere ọrụ dịka onye nchịkọta ji họpụta Bikila.
Niskanen bidoro na-akụziri Bikila etu e sị agba ọsọ ike agwụ nwamkpị (marathon).
Onye kwesịrị ịga olimpik bụ Rome Games mana o malitere ịrịa ọrịa nke mere e ji were Biliki nchiteanya mba Ethiopia.

Ebe foto si, Getty Images
Ọlaedo nke abụọ Bikila nwetere na Tokyo Olimpik
N'afọ 1964 ka Bilika nwetere ọlaedo nke abụọ mere ya onyeisi ojii nke mbụ turuugo n’olimpiki ugboro abuo so onwe ha n'azụ.
Rụọ taa, Bilika sonyere onye Germany bụ Waldemar Cierpinski na onye Kenyan bụ Eliud Kipchoge na ndị meriri ma nwete ọlaedo ugboro abụọ.
Mana ihe dị iche bụ na ndị ọzọ yi akpụkpụ ụkwụ.
Ka ọ fọrọ abalị 40 tupu Tokyo olimpiki ebido, awara Bikila ahụ apendix.
Bilika gara n’ihu merie ma guzobe ndeko ọzọ. O ji nkeji iri na abụọ na tịnkọm tịnkọm iri na otu wee merie nke a.
Ndekọ ndị Olimpiki kwuru na ọsọ mbaụwa a gbara bido n'afọ 1960 ruo n'afo 1966 na Bilika meriri 12 n’ime 13 a gbara. Mana o nwere ihe mgberede n'afọ ise ka ọ gachara Olimpiki nke abụọ ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ije Bilika na ihe mgberede
N'ọnwa Maachị afọ 1969 ka Bilika jị ụgbọala ya nwee ihe mgberede okporoụzọ nke kpọnwụrụ ahụ ya site n’ọnụ ruo na mgbada ala.
E bugara ya ụlọọgwụ na-ahụ maka ọkpụkpụ azụ dị na Stoke Mandeville, England. E mere ka ọ mata na ọ gaghị aga ije ọzọ.
Mana o mechere nweeike iji aka ya were na-eme ihe nke mere o jiri soro na-eme asọmpị tebụlụ tenis na ndị ọzọ ma nwetakwa mmeri n'asọmpị ndị nwere nkwarụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe e ji echeta ya
N'afọ 1973, Bikila nwụrụ mgbe ọ dị afọ ịrị anọ na otu maka ọrịa sitere n’ihe mgberede okporoụzọ ahụ o nwere.
Emperor Haile Salassie nyere ịwụ ka Ethiopia niile nọọ n'ọnọdụ iru-uju gbasara ọnwụ ya ma kwaa ozu ya.
Ka ọ nwụchara, ihe ncheta ya ka dịkwa. E nwere ama egwuregwu Abebe Bikila dị n'Addis Ababa nakwa ụlọakwụkwọ dị iche iche na-aza aha ya.
Ọtụtụ ndị Kenya na Ethiopia dịka Haile Gebrselassie na Eliud Kipchoge bụ ndị sonyere nzọmụkwụ ya ma bụrụ ndị a ma ama n'asọmpị ịgba ọsọ.
Getnet Wale bụ onye ga-anọchiteanya Ethiopia n'egwuregwu Olimpik 2024 a ga-eme na Paris kọwara Bilika dịka onye na-enweta mmeri.
“Ọ bụ onye mbụ. Anyị na-echeta ya rụọ taa”.









