Ọgba Mbọ: Lee Afam Dozie, onye na-akpọlịte ụgbọala mgbe ochie n'ọnwụ
- Onye dere ya, Chigozie Ohaka & Vining Ogu
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist & Video Journalist
Igbo na-atụ ilu sị na 'ihe onye na-eme ka ekwe ji akpọ ya'.
Nke a bụ eziokwu na ndụ Afam Doze, nwa amadị e ji ịkpọlite ụgbọala ochie nke ndị mmadụ che na ọ nwụọla n'ọnwụ.
Dozie gwara BBC Igbo na ya malitere ịhụ ọrụ ụgbọala n'anya oge ọ bụ nwata, maka na nna ya bụkwa ọrụ ahụ ka ọ na-arụ.
O kwuru na ọ bụ oge o lelere onyonyo otu onye mba Amerịka na-emegharị ụgbọala ochie, ka ya onwe ya nwere mkpalite na mmụọ ya ịbanye ya bụ ọrụ nke ọma.

Ugbua, Dozie so n'otu n'ime ndị a kacha mara na Naịjirịa na-agbanwe ụgbọala ochie, mee ya ka ọ dịkwa ka nke ọhụrụ.
"Ebumnobi m bụ na n'oge adịghị anya, aga m enwe ike ịrụpụta ụgbọala nke aka m site n'isi mbido ruo na njedebe," Dozie kwuru.
Kirie mkparịtaụka a n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Vining Ogu.





