Ọgba Mbọ: Lee Joy Nwokeocha, nwaanyị ji ụdara nwannu emepụta 'juice' na 'jam'

Aha onyonyo, Joy Nwokeocha - Nwaanyị "ụdara juice"

Joy Nwokeocha bụ ọkachamara n'iji nri eme ka ahụịke mmadụ kawanye mma; bekee na-akpọ ya "Clinical nutritionist".

Ọrụ ya bụ ịchọpụta ihe ndoziahụ dị icheiche jupụtara na nri mmadụ na-eri nakwa etu ị ga-esi rie ya ka ahụ gị nabata ya.

Oriaku Joy Nwokeocha kọọrọ BBC Igbo etu o si malite iji ụdara emepụta mmanya ụtọ Bekee kpọrọ Juice, nakwa ihe ụtọ e ji ata achịcha, a na-akpọ 'jam' na bekee.

O kwuru na ụdara nwere ọtụtụ akụrụngwa na-edozi ahụ, ọ kachasị 'viscus fibre' nke na-enye aka ewepụta oke abụba dị mmadụ n'ahụ.

N'ihi nke a, oge ụmụ ya jụrụ na ha agaghị aracha ụdara, Joy Nwokeocha malitere iche ụzọ ọzọ ọ ga-esi mee ka ụmụ ya nwee mmasị ịracha ụdara.

Nke a mere o ji chepụta iji ụdara eme mmanya ụtọ nakwa 'jam' e ji ata bureedi.

"Ndị niile ṅụrụla mmanya a m ji ụdara mee na-ekwu na ọ na-atọba ha n'ụbụrụ," oriaku Nwokeocha kwuru.

"Ugbua, naanị ezinụlọ m, ndị enyi m, na ndị enyi di m ka m na-emere ya, mana enwere m olileanya, otu ụbọchị, imepụta ya ebe o buru ibu na-ere ya n'ahịa."

Joy Nwokeocha kọkwara ihe ndị na-echere ya aka mgba imepụta "ụdara juice" n'ebe o buru ibu.

"Nke mbụ bụ ọkụ latrik. N'ihi na anaghị m etinye akụrụngwa 'preservatives' ọbụla iji mee ka mmanya a nọtee aka, ọ dị mkpa ka ọ na-adị n'ime igwe njụoyi oge niile."

"Ọzọkwa bụ etu m ga-esi na-enweta ụdara nwannu kwa afọ, maka na ụdara nwere oge o ji apụta nakwa oge o ji akọ."

"Mana enwere m olileanya na aga m emeri ihe ndị a niile na-echere m aka mgba n'oge adịghị anya."

Dịka onye ọkachamara n'iji nri ewulite ahụike, Joy Nwokeocha kwuru na ọ dị mkpa ị na-eri nri dị kc chi si kee ya, na-abụghị nri ndị a rụpụtara arụpụta.

"Ọtụtụ akwụkwọ nri na mkpụrụosisi anyị na-eri nwere ọtụtụ ihe ọma jupụtara n'ime ha na-edozi ahụ, ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri ndị a, ọrịa ga-anọte aka n'ebe onye ahụ nọ," ka o kwuru.