Ọgba mbọ: Etu m si hibe ụlọọrụ si Naijiria ebuga ngwa nri na mba ofesi
Naijiria bụ obodo e ji itụbata ihe mara, nke bekee na-akpọ 'import-dependent' nation.
Mana nwa ada Igbo a aha ya bụ Princess Vivian Agboanike na-esi na Naijiria na-ebupụ ihe oriri dị icheiche gaa mba ofesi.
Princess kọọrọ BBC Igbo na ọ malitere ọrụ a oge ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị, wee na-achọ ihe ọ ga na-eme tupu ọ banye mahadum.
"Amalitere m ịga n'ụlọ n'ụlọ na-ajụ ndị mmadụ ma enwere ozi m ga-agara ha," Princess kwuru.
"Otu a ka m si bido igotere ndị mmadụ ngwa nri dị icheiche n'ụlọ ha."
Oge ọ gụchara mahadum, Princess chọpụtara na ọtụtụ ụmụ Naijiria bi mba ofesi na-achọ onye ga na-ezitere ha ihe oriri si Naijiria.
Nke a mere o ji gaa ọzụzụ maka ibupụ ngwa nri n'obodo ọzọ, biakwa denye aha ya n'otu a kpọrọ 'Nigeria Export Organisation'.
Ugbua, Princess nwere obere ụlọọrụ na-ebupụ ngwa nri dị icheiche gaa ọtụtụ mba ụwa ebe ụmụ Naijiria bicha.
Princess kwuru na mgbe ọ malitere ọrụ, ụmụnne ya anabataghi ya, mana ugbua, onye ọbụla etinyela aka na ya.
"Naanị nne m nyere m nnukwu nkwado oge m na-amalite, mana ọ bụ ihe mwute na ọ laala mmụọ ugbua," ka o kwuru.
"Ndị ọrụ m ugbua akariala iri isii, tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ na-agara m ahịa izụtara m ngwa nri."
Ihe ndị ha na-esi Naijiria ebuga mba ofesi gụnyere: akwụkwọ nri dị icheiche, ose ọkpọọ na nke ndụ, mkpụrụ osisi dika mkpụrụ kashuu, ahụekere, jinja, egwusi, ọgbọnọ, azụ ọkpọọ, ji na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Princess kwuru na otu ihe nhịahụ dị n'ọrụ ha bụ na gọọmenti Naijiria anaghị enyere ha aka nke ọma.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chukwunaeme Obiejesi.