Ọgba Mbọ: Ọ bụ onyinye Chukwu nyere m ka m ji akpata ego oriri - Ifeyinwa Oduche

Aha onyonyo, Ọ bụ onyinye Chukwu nyere m ka m ji ebi

Ifeyinwa Oduche bụ nwa agbọhọ eji ọtụtụ akaraka gozie.

Ọ na-arụ akpụkpọụkwụ, ọ na-agba bọolụ ma na-etekwa egwu.

Ọ gwara BBC Igbo etu o si wee mụta akaọrụ ndị a niile, o gosikwara anyị ka o si eme ihe ndị ọ na-eme.

Ndụmọdụ o nyere ndị mmadụ bụ iji akaọrụ ha nwere ọfụma ma jisie ya ike.

Ọ gwara ndị ntoroọbịa ibe ya ka ha hapụ iche naanị ọrụ oyibo ma bido akaọrụ nke ha.

Lelee maka nwaada a pụrụ iche: