Ọgba Mbọ: Kamgbe m dị na nwata ka ihe ntecha bidoro masịwa m - Arinze Ekwugha

Aha onyonyo, Nwoke na-ete ntecha

Ịchọ mma abụghị ihe ọhụrụ n'ala Igbo,

Tupu ndị ọcha abịa, ndị Igbo oge gboo na-eji uli na ihe ndị ọzọ achọ onwe ha mma.

Ọ bụ ụmụnwaanyị na-eme ihe ntecha karịa kamgbe gboo.

Dịka oge na-aga, ọ pụtara na ọ na-abụkarị ụmụnwaanyị na-eji ime ihe ntecha (nke bụ Makeup n'asụsụ Bekee) dịka aka ọrụ ha.

Kama ugbua, ụfọdụ ụmụ nwoke ebidola itinye anya na ya bụ nka ma na-emeta ya nke ọma.

Ekwugha Samuel Arinze bụ nwoke na-eme ihe ntecha n'obodo Ọka nke Anambra Steeti, Naijirịa.

Ọ kọwara na ịchọ mma dịka ịkwalite mma mmadụ maburu na mbụ.

Ekwugha kwuru sị, "Dịka m gụchara Mahadum, achọpụtara m na enwere m mmasị ime ihe ntecha".

O kwuru sị, "ọ bụ ihụnanya m nwere ebe ihe ntecha nọ mere ka aka m ji chawapụ, nke mere ka ndị mmadụ na-akpọ m ugbu a".

Ekwugha kwuru sị, "nwoke chọrọ ime ihe ntecha ga-ahapụ oringo dị na ya ma tinye uchu na ya n'ihi na ego dị na ya".

Ọ na-atụ anya na n'ime afọ abụọ ma ọ bụ atọ na ụwa niile ga-anụ aha ya.

Lee ihe onyonyo a ka ị mata ihe gbara Ekwugha ume na ihe mere ka ntecha nke ya pụọ iche.

Ọ bụ Vining Ogu na Chris Okereke mere akụkọ a