Ọgba mbọ: Lee Nwoke gbara afo 57 nwaanyi na-anwuru ka o mee ha isi

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: M na-ahazibu egwu, mana ugbua mụ na ụmụ m na-emezi ụmụnwaanyị isi

Success Okorie bụ nwoke dị afọ 57 ji ime ụmụnwaanyị isi agba mbọ n'Owere, Imo steeti.

Okorie gwara BBC Igbo etu o si malite n'ihazi egwu ma si na ya wụbanye n'imezi isi kemgbe afọ 35 gara aga.

Ka o si kwuo, ọ zụọla ihe ruru mmadụ narị anọ (400) n'ọrụ aka a.

O kwukwara na ụmụ ya amụọla ọrụ aka ya a, ma jirikwa ya na-akpa ego n'agbanyeghi na ha agachaala mahadum

Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju:

Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke na Nnamdi Agbanelo